Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 55:22

Verse 22 is marked below, with the whole chapter around it. Read from the start

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid.

Ekpere nke onye enyi ya ghọrọ ya aghụghọ

O Chineke, nụrụ ekpere m,

agbakwala arịrịọ m nkịtị;

ṅaa m ntị, zaakwa m.

Echiche m na-esogbu m; ana m asụkwa oke ude

nʼihi ihe onye iro m na-ekwu,

nʼihi ịba mba nke ndị ajọ mmadụ,

nʼihi na ha na-ewetara m ntaramahụhụ,

na-akpagbu m nʼiwe ha.

Obi m nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nʼime m;

oke ụjọ nke ọnwụ abịakwasịla m.

Ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji abịakwasịkwala m;

oke egwu ekpuchiela m.

Agwara m onwe m okwu sị, “A sịkwarị na m nwere nku dịka nduru!

Agaara m efelaga ebe ọzọ gaa zuru ike.

Agaara m efelaga ebe dị anya,

ga nọrọ nʼọzara; Sela

Agaara m eme ngwangwa gaa nʼebe mgbaba m,

ebe dị anya site nʼebe ifufe siri ike na oke ifufe dị.”

O Onyenwe anyị, gbagwojuo ndị ajọ omume anya, mee ka ha ghara ịghọta ihe ibe ha na-ekwu,

nʼihi na ana m ahụ ihe ike na ịlụ ọgụ nʼime obodo.

Ehihie na abalị, ha na-ejegharị nʼelu mgbidi ya;

iro na mmegbu dị nʼime ya.

A na-ahụta akaọrụ ihe ịla nʼiyi nʼime obodo;

ihe ike na ụgha ewerela ọnọdụ ha nʼime obodo.

A sị na ọ bụ onye iro ji m eme ihe ọchị,

apụrụ m ịnagide ya;

a sịkwa na ọ bụ onye iro na-eweli onwe ya megide m,

apụrụ m izonarị onwe m site nʼebe ọ nọ.

Maọbụ gị, nwoke dịka m,

onye mụ na ya dị na mma, enyi m ọma,

onye mụ na ya na-enwe mmekọrịta dị ụtọ na mbụ,

nʼụlọ Chineke,

ka anyị na-ejegharị

nʼetiti ọha mmadụ bịara ife ofufe.

Ka ọnwụ bịakwasị ndị iro m na mberede;

ka ha rịdaa ala mmụọ na ndụ,

nʼihi na ihe ọjọọ na-achọta ebe ọnọdụ nʼetiti ha.

Ma akpọkuru m Chineke,

Onyenwe anyị na-azọpụtakwa m.

Nʼụtụtụ, ma nʼehihie, ma nʼabalị,

ka m sitere nʼoke ihe mgbu, na-akpọku ya

ma ọ na-anụkwa olu m.

Ọ na-agbapụta m, mee ka m ghara imerụ ahụ,

site nʼagha niile e busoro m,

nʼagbanyeghị nʼọtụtụ biliri megide m.

Chineke, onye nọkwasịrị nʼocheeze ya ruo mgbe ebighị ebi,

onye na-adịghị agbanwe,

ga-anụ olu ha, taakwa ha ahụhụ,

nʼihi na ha adịghị atụ egwu Chineke. Sela

Onye mụ na ya dị na mma na-emegide ndị enyi ya,

ọ na-emerụ ọgbụgba ndụ ya ka ọ ghara ịdị nsọ.

Okwu ọnụ ya dị mụrụmụrụ1 ka bọta,

ma ibu agha juru ya obi;

okwu ya niile dị nro karịa mmanụ,

ma ha bụ mma agha e welitere maka ibu agha.

Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile,

ọ ga-agba gị ume;

ọ gaghị ekwe

ka ewezuga onye ezi omume.

Ma gị, O Chineke, ga-adọtu ndị ajọ omume

nʼime olulu nke jupụtara nʼire ure;

ndị ogbu mmadụ na ndị aghụghọ

agaghị ebi ọ bụladị ọkara ndụ ha.

Ma mụ onwe m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.

Source notes (1)
  1. Footnote Ya bụ, okwu ire ụtọ

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.