Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 54
Abụ Ọma Devid. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid. Mgbe ndị Zif gara sị Sọl, “Devid ọ dịghị ezo nʼetiti anyị?”
Ekpere maka nchebe
O Chineke, jiri aha gị zọpụta m;
jirikwa ike gị kpepụta m.
O Chineke, nụrụ ekpere m;
gee ntị nʼokwu ọnụ m.
Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha;
ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m,
ndị na-akpọghị Chineke ihe ọbụla. Sela
Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m;
onyenwe m bụ onye na-agba m ume.
Mee ka ihe ọjọọ lọghachikwute ndị na-ekwulu m;
nʼime ikwesi ntụkwasị obi gị, laa ha nʼiyi.
Aga m eji onyinye afọ ofufu chụọrọ gị aja;
O Onyenwe anyị, aga m eto aha gị, nʼihi na ọ dị mma.
Nʼihi na ọ gbapụtala m site na nsogbu m niile,
ọ bụ anya mmeri ka m ji na-ele ndị iro m anya.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.