Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 53

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro Mahalat. Abụ maskil Devid.

Nzuzu nke ndị na-emebi iwu

Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya,

“Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.”

Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ụzọ ha niile bụkwa ihe arụ;

ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe.

Chineke sitere nʼeluigwe

na-ele ụmụ mmadụ anya,

ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta,

onye nke na-achọ Chineke.

Onye ọbụla, nʼotu nʼotu ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ;

ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi,

ọ dịghị ọ bụladị otu onye.

Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe?

Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri,

ha adịghị akpọkukwa Chineke.

Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu,

ebe ọ dịghị ihe egwu na-adịghị.

Chineke fesasịrị ọkpụkpụ ndị niile megidere gị;

i mere ka ihere mee ha, nʼihi na Chineke ajụla ha.

O, a sịkwarị na nzọpụta Izrel ga-esi na Zayọn pụta!

Mgbe Chineke ga-akpọghachite ndị ya nʼọnọdụ ha,

ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwekwaa obi ụtọ!

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.