Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 52
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ maskil Devid. Nke o bụrụ mgbe Doeg onye Edọm gara gwa Sọl sị, “Devid gara hụ Ahimelek nʼụlọ ya.”
Ihe na-eche ndị ajọ omume
Gịnị mere i ji na-anya isi nʼihe ọjọọ, gị nwoke dị ike?
Gịnị mere na ogologo ụbọchị niile, ị na-anya isi,
gị onye Chineke na-eleda anya?
Ire gị na-atụ atụmatụ ịla nʼiyi;
ọ dị ka agụba dị nkọ,
gị onye na-ebi ndụ aghụghọ.
Ị hụrụ ihe ọjọọ nʼanya karịa ihe ọma,
ị hụrụ okwu ụgha nʼanya karịa eziokwu. Sela
O onye ire aghụghọ!
Ị hụrụ okwu ọbụla nke na-emegide mmadụ nʼanya.
Nʼezie, Chineke ga-akwatu gị ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ ga-ejide gị, dọpụta gị site nʼụlọ ikwu gị,1
ọ ga-ehopukwa gị site nʼala ndị dị ndụ. Sela
Ndị ezi omume ga-ahụ ya tụkwaa egwu;
ha ga-achị ya ọchị na-asị,
“Ugbu a, lee nwoke ahụ,
onye jụrụ ime Chineke ebe mgbaba ya.
Ọ tụkwasịrị obi ya na akụnụba ya nke dị ukwuu.
O sitekwara na ibibi ndị ọzọ ghọọ onye dị ike!”
Ma adị m ka osisi oliv,
nke na-eto na-awasa nʼụlọnsọ ukwu Chineke.
Ana m atụkwasị obi m nʼịhụnanya Chineke,
nke na-adịgide ruo mgbe niile ebighị ebi.
Aga m eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi nʼihi ihe i mere;
aga m eto gị nʼihu ndị gị dị nsọ.
Olileanya m ga-adị nʼime aha gị,
nʼihi na aha gị dị mma.
Source notes (1)
- Footnote Ya bụ, ebe obibi ya
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.