Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 56

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Ọ bụ olu abụ “Nduru nọ nʼosisi Ook dị ebe dị anya.” Abụ nke Devid ka eji agụ ya. Abụ miktam. Mgbe ndị Filistia nọchibidoro ya nʼobodo Gat.

Ekpere maka mgbapụta

O Chineke, meere m ebere,

nʼihi na ndị mmadụ ji ike na-achụso m;

ogologo ụbọchị niile, ha na-ebu agha imegide m.

Ogologo ụbọchị niile ndị iro m na-achụso m;

site na nganga ha, ọtụtụ na-ebu agha megide m.

Ma mgbe ụjọ na-atụ m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.

Nʼime Chineke onye m na-eto okwu ya,

nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m.

Gịnị ka mmadụ efu pụrụ ime m?

Ogologo ụbọchị niile, ha na-asụgharị okwu m kwuru isi;

oge niile ka ha na-atụ atụmatụ imerụ m ahụ.

Ha na-agba izu nzuzo na-ezokwa onwe ha,

ha na-enyochapụta nzọ ụkwụ m niile,

dịkwa njikere ịnapụ m ndụ m.

Nʼihi ajọ omume ha, ekwekwala ka ha gbapụ;

o Chineke, nʼime iwe gị, wedaa mba ndị a niile dị iche iche nʼala.

Depụta akwa arịrị m;

chekọtasịa anya mmiri akwa m niile nʼime karama gị.

Ọ bụ na ha adịghị nʼakwụkwọ ndepụta gị?

Mgbe m ga-akpọku gị maka enyemaka,

ndị iro m ga-agbaghachi azụ.

Site nʼụzọ dị otu a, aga m amara na Chineke nọnyeere m.

Nʼime Chineke, onye m na-eto okwu ya,

nʼime Onyenwe anyị, onye m na-eto okwu ya,

nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m.

Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?

O Chineke m, nʼisi m ka nkwa niile m kwere gị dị;

aga m ewetara gị onyinye ekele m niile.

Nʼihi na ị zọpụtala m site nʼọnwụ,

ma napụta ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ,

ka m nwee ike jegharịa nʼihu Chineke,

nʼìhè nke ndụ.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.