Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 57

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala” Devid. Abụ miktam. Mgbe ọ gbapụrụ ga biri nʼime ọgba nkume nʼihi Sọl.

Ntụkwasị obi nʼime Chineke

Meere m ebere, O Chineke, meere m ebere,

nʼihi na ọ bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba.

Ọ bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbaba

tutuu ihe mbibi ndị a agafesịa.

Aga m akpọku Chineke nke kachasị ihe niile elu,

Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa.

Ọ na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta m

na-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba; Sela

Chineke na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya.

Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm;

amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa,

ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe,

ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha.

O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe niile;

ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.

Ha gbasaara ụkwụ m ụgbụ,

ihe mgbu nyịturu m.

Ha egwuola olulu nʼụzọ m si agafe,

ma ha onwe ha adabala nʼime ya. Sela

Obi m dị njikere, o Chineke,

obi m dị njikere sikwaa ike;

aga m abụ abụ, kụkwaa egwu.

Teta nʼụra mkpụrụobi m!

Teta, ụbọ akwara na une!

Aga m akpọte chi ọbụbọ.

O Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile;

aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.

Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu na-eru na mbara eluigwe;

ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.

O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe;

ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.