Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 58

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala.” Abụ Devid. Abụ miktam.

Ahụhụ nke ndị na-emebi iwu

Unu ndị na-achị achị, O nweela oge unu na-ekwu ihe ziri ezi?

O nweela oge unu na-ekpe ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ?

Mba, nʼime obi unu, unu na-echepụta mmegbu,

aka unu na-emepụta ihe ike nʼelu ụwa.

Ọ bụladị site nʼọmụmụ, ndị ajọ omume na-akpafu;

site nʼime afọ, ha na-akpafu akpafu na-ekwusa okwu ụgha.

Ha na-agbọpụta nsi nʼọnụ ha dịka agwọ,

na-emechi ntị ha dịka ajụala ntị chiri,

nke na-adịghị anụ olu onye mgbaasị na-akpọpụta ya,

nʼagbanyeghị otu ǹka onye ahụ si dị.

O Chineke, tijie eze niile dị ha nʼọnụ;

o Onyenwe anyị, dọpụta eze ọdụm ndị a!

Mee ka ha sọfuo dịka mmiri na-asọ asọ;

mgbe ha na-eseti ụta ha, mee ka ọnụ àkụ ha gbajie.

Dịka ejula nke na-agbaze mgbe ọ na-aga nʼụzọ ya;

dịka nwa nwụrụ nʼafọ nne ya, ka ha ghara ịhụ anyanwụ.

Tupu ite unu amata okpomọkụ nke osisi ogwu,

ma ha dị ndụ, ma ha kpọnwụrụ akpọnwụ, a ga-azachapụ ndị ajọ omume.

Ndị ezi omume ga-enwe obi ụtọ mgbe a bọọrọ ha ọbọ,

mgbe ha ga-asacha ụkwụ ha nʼime ọbara ndị ajọ omume.

Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ekwu sị,

“Nʼezie, a na-akwụghachi ndị ezi omume ụgwọ;

nʼezie, e nwere Chineke onye na-ekpe ụwa ikpe.”

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.