Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 27
Abụ Ọma Devid.
Abụ nke iguzosi ike
Onyenwe anyị bụ ìhè1 m na nzọpụta m,
onye ka m ga-atụ egwu ya?
Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m,
ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?
Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha
ka ha ripịa anụ ahụ m,
ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị,
bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa.
Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu,
obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla;
ọ bụladị na agha adaa imegide m,
nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi.
Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị,
nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike;
ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị
ụbọchị niile nke ndụ m,
na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị,
na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.
Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu,
ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya;
ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya;
ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume.
Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu
karịa ndị iro m gbara m gburugburu;
aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya;
aga m abụ abụ, kụọ egwu nye Onyenwe anyị.
Gee ntị mgbe m na-akpọku gị Onyenwe anyị.
Meere m ebere, zaa m.
Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!”
Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ.
Ezonarịla m ihu gị,
agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe;
nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m.
O Chineke, Onye nzọpụta m,
ahapụkwala m.
Ọ bụrụrị na nne na nna m ahapụ m,
Onyenwe anyị ga-anabata m.
Zi m ụzọ gị, O Onyenwe anyị;
duo m nʼụzọ kwesiri
nʼihi ndị na-akpagbu m.
Ararala m nyefee nʼaka ndị kpọrọ m asị nʼihi ọchịchọ ha,
ọtụtụ ndị ama ụgha ebiliela imegide m,
ha na-ekupụ ihe ike dịka ume.
Olileanya m bụ nke a:
Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị
nʼala ndị dị ndụ.
Chere Onyenwe anyị;
dịrị ike, nwekwaa ume,
ma chere Onyenwe anyị.
Source notes (1)
- Footnote Aịz 60:19-20; Mai 7:8
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.