Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 26

Abụ Ọma Devid.

Ekpere nke ezi mmadụ

Onyenwe anyị, biko kpepụta m,

nʼihi na ebiela m ndụ zuruoke;1

atụkwasịrị m Onyenwe anyị obi,

na-eleghị anya nʼazụ.

Tulee m, O Onyenwe anyị, ma nwakwaa m,

nyochaa obi m na echiche m.

Nʼihi na ejirila m ịhụnanya gị mere ihe nlere anya nye onwe m.

Ana m ejegharịkwa nʼime eziokwu gị.

Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla.

Otu a kwa, nnwekọ ọbụla adịghịkwa nʼetiti mụ na ndị ihu abụọ.

Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị.

Mụ na ndị ajọ omume agaghị anọkọkwa.

Ana m asacha aka2 m abụọ nʼọnọdụ emeghị ihe ọjọọ,

na-eje ozi nʼebe ịchụ aja gị ife gị ofufe, o Onyenwe anyị.

Ana m abụkwa abụ ekele,

jiri iti mkpu na-ekwusa otuto gị, na ọrụ ebube gị niile.

O Onyenwe anyị, ahụrụ m ụlọ obibi gị nʼanya,

ụlọ ahụ ebe ebube gị na-adịgide nʼime ya.

Ebibikọtala mụ na ndị mmehie,

ewezugakọtala ndụ m na nke ndị na-awụfu ọbara,

ndị aka ha jupụtara nʼatụmatụ ọjọọ,

aka nri ha jupụtakwara na ngarị.

Ma mụ onwe m na-ebi ndụ zuruoke;

gbapụta m ma meere m ebere.

Ụkwụ m na-eguzo nʼala dị larịị;

aga m eto Onyenwe anyị nʼetiti ọha mmadụ.

Source notes (2)
  1. Footnote 2Ez 20:2; Ilu 20:7
  2. Footnote Ọ bụrụ na mmadụ asacha maọbụ kwọọ aka ya nʼihu ọha, ọ na-apụta ngọpụ site nʼihe na-ezighị ezi, maọbụ onye dị otu a na-asị, ikpe amaghị m. Abụ 73:13

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.