Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 25

Abụ Ọma Devid.

Ekpere maka odudu na nnapụta

Ọ bụ na gị Onyenwe anyị

ka m tụkwasịrị obi m.

O Chineke m, ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi m.

Ekwela ka ihere mee m,

ekwekwala ka ndị iro m merie m.

Ihere agaghị eme

onye ọbụla olileanya ya dị na gị,

ma ihere ga-eme ha

bụ ndị niile ịghọ aghụghọ jụrụ ahụ.

O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile,

kuzikwaara m ụzọ gị niile.

Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe,

nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile,

olileanya m dị na gị.

Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị,

nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie.

Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m,

ya na nnupu isi m niile.

Kama site nʼịhụnanya gị cheta m,

Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ.

Onye dị mma na onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ;

ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya.

Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi,

na-ezikwa ha ụzọ nke ya.

Ụzọ niile nke Onyenwe anyị jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi,

nye ndị niile na-edebe iwu ọgbụgba ndụ ya.

Nʼihi aha gị, O Onyenwe anyị,

gbaghara m ajọ omume m nʼagbanyeghị na ha dị ukwuu.

Olee mmadụ ahụ nke na-atụ egwu Onyenwe anyị?

O ga-ezi ya ihe nʼụzọ ahụ a họpụtaara ya.

Ọ ga-ebi ogologo ụbọchị nke ndụ ya nʼime ịba ụba,

ndị agbụrụ ha ga-eketa ala ahụ.

Onyenwe anyị na-eme ka ndị ahụ na-atụ egwu ya mara

ọgbụgba ndụ ya na izu nzuzo ya.

Anya m abụọ na-elegide Onyenwe anyị mgbe niile;

nʼihi na ọ bụ naanị ya ga-eme ka ụkwụ m abụọ site nʼọnya pụta.

Chee m ihu ma gosi m ebere gị,

nʼihi na abụ m onye nọ na nsogbu, naanị m nọkwa.

Ihe mgbu nke obi m abaala ụba,

napụta m site nʼobi mwute.

Lekwasị nsogbu m na ihe mgbu m anya.

Biko, gbaghara m mmehie m niile.

Lee ka ndị iro m si mụbaa,

ha ji oke iwe kpọọ m asị.

Chebe ndụ m ma gbapụta m;

ekwela ka m bụrụ onye ihere ga-eme,

nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ

Kwere ka ezi omume na izuoke bụrụ ihe ga-agba m gburugburu,

nʼihi na olileanya m dị nʼime gị.

O Chineke, Gbapụtakwa Izrel,

site na nsogbu ya niile.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.