Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 28

Abụ Ọma Devid.

Ekpere maka enyemaka na-ekele

Gị Onyenwe anyị ka m na-akpọku;

gị bụ Oke nkume m,

agbala m nkịtị.

Ọ bụrụ na ị jụ ịza m,

aga m eyi otu nʼime ndị ahụ na-arịda nʼolulu.

Nụrụ arịrịọ m maka ebere

dịka m na-akpọku gị maka enyemaka,

mgbe m chịlịri aka m abụọ elu

nʼEbe gị Kachasị Nsọ.

Adọkpụrụla m tinyere ndị ajọ mmadụ,

tinyekwara ndị na-eme ajọ ihe,

ndị ji ire ụtọ agwa ndị agbataobi ha okwu udo,

ma ha bu iro nʼime obi ha.

Kwụghachi ha dịka ọrụ ọjọọ ha

na omume ha kwesiri;

kwụghachi ha maka ihe aka ha mere,

ka ihe ga-adakwasị ha bụrụ ihe ha kwesiri iketa.

Nʼihi na ha adịghị aghọta ọrụ niile nke Onyenwe anyị,

ha adịghịkwa aghọta ihe aka ya abụọ rụrụ,

ọ ga-akwada ha nʼala,

ọ gaghị ewulikwa ha elu ọzọ.

Toonu Onyenwe anyị,

nʼihi na o gere ntị nʼarịrịọ m rịọrọ ya ka o meere m ebere.

Onyenwe anyị bụ ike m na ọta m;

ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka.

Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ,

aga m ejikwa abụ m na-eto ya.

Onyenwe anyị bụ ike nke ndị ya,

ebe mgbaba e wusiri ike nke nzọpụta dịịrị onye ya etere mmanụ.

Zọpụta ndị gị, gọzikwaa ihe nketa gị;1

buuru ha onye ọzụzụ atụrụ, na-ekukwa ha ruo mgbe ebighị ebi.

Source notes (1)
  1. Footnote Maọbụ, ndị nke gị

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.