Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 29
Abụ Ọma Devid.
Olu Onyenwe anyị
Toonu Onyenwe anyị, unu ndị bi nʼeluigwe,
nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ nʼihi ebube na ike ya.
Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ kwesiri aha ya;
kpọọ isiala nye Onyenwe anyị nʼebube nke ịdị nsọ ya.
Olu Onyenwe anyị na-ada nʼelu osimiri;
olu Chineke dị ebube na-ada ike ike,
olu Onyenwe anyị na-ada dịka egbe eluigwe1 nʼelu oke osimiri.
Olu Onyenwe anyị dị ike,
olu Onyenwe anyị jupụtakwara nʼebube.
Olu Onyenwe anyị na-etiwa osisi ukwu sida;
Onyenwe anyị na-etiwasị osisi ukwu sida nke Lebanọn.
Ọ na-eme ka Lebanọn wulie elu dịka nwa ehi,
ọ na-eme ka Siriọn2 wulie elu dịka nwa atụ.
Olu Onyenwe anyị na-agba dịka egbe eluigwe
mgbe amụma na-egbu.
Olu Onyenwe anyị na-eme ka ọzara maa jijiji;
Onyenwe anyị na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji.
Olu Onyenwe anyị na-eme ka osisi ook gbagọọ3
na-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa.
Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, “Ebube!”
Onyenwe anyị nọ nʼocheeze ya nʼelu uju mmiri;
Onyenwe anyị na-achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi.
Onyenwe anyị na-enye ndị ya ike,
ọ ga-ejikwa udo gọzie ndị ya.
Source notes (3)
- Footnote Job 37:4-5; Abụ 18:13
- Footnote Nke a bụ aha ndị Fonikisi bi na mpaghara ugwu Hemon na-akpọ ugwu ahụ. Hemon dị nʼoke ala nkwa ahụ nʼebe ugwu. Dit 3:9; Abụ 42:6
- Footnote Ime na-eme nne ele
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.