Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 150
Ka ihe niile too Onyenwe anyị
Toonu Onyenwe anyị.
Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya.
Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya.
Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya.
Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile.
Werenụ opi ike too ya,
werekwanụ ụbọ akwara na une too ya,
jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya,
jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya,
werenụ ogene too ya,
werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya.
Ka ihe niile na-eku ume too Onyenwe anyị.
Toonu Onyenwe anyị.1
Source notes (1)
- Footnote Mgbe mmadụ na-eti, Toonu Onyenwe anyị, ya na onye na-eti Haleluya, na-ekwu otu ihe ahụ.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.