Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 149

Abụ otuto

Toonu Onyenwe anyị!

Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ.

Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya.

Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha;

ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze1 ha.

Ka ha jiri ite egwu too aha ya

ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu.

Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ Onyenwe anyị ụtọ.

Ọ na-eji nzọpụta2 kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze.

Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a,

bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha.

Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha,

ka mma agha ihu abụọ3 dịrịkwa nʼaka ha,

iji bọọrọ mba niile ọbọ

taakwa ndị niile dị iche iche ahụhụ,

iji mkpọrọ igwe kee ndị eze ha

na ndị ha a na-asọpụrụ agbụ igwe,

imezu ihe ahụ e kpebiri, depụtakwa megide ha.

Nke a bụ nsọpụrụ dịrị ndị nsọ ya.

Toonu Onyenwe anyị.

Source notes (3)
  1. Footnote Nkp 8:23; Zek 9:9; Mat 21:5
  2. Footnote Abụ 132:16; Aịz 61:10
  3. Footnote Hib 4:12; Mkp 1:16

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.