Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 148

Toonu Onyenwe ihe niile

Toonu Onyenwe anyị.

Toonu Onyenwe anyị site nʼeluigwe,

toonu ya nʼebe niile kachasị elu.

Toonu ya, ndị mmụọ ozi ya niile,

toonu ya, unu usuu ndị agha ya niile.

Toonu ya, anyanwụ na ọnwa

toonu ya, kpakpando niile.

Toonu ya, unu eluigwe kachasị elu

na unu mmiri dị nʼelu mbara eluigwe.

Ka ha niile too aha Onyenwe anyị,

nʼihi na ha niile malitere ịdị site nʼokwu ọnụ ya.

O doro ha nʼọnọdụ ha ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi;

o nyere iwu nke a na-agaghị agabiga.

Toonu Onyenwe anyị, site nʼụwa,

unu oke anụ mmiri niile na ogbu mmiri niile,

na amụma, na mkpụrụ mmiri, na snoo na igwe ojii niile,

na oke ifufe niile na-eme ihe o nyere nʼiwu,

unu ugwu ukwu niile, na ugwu nta niile

na osisi niile na-amị mkpụrụ na osisi sida niile

na anụ ọhịa, na anụ ụlọ niile,

na ihe niile na-akpụ akpụ nʼala na nnụnụ niile,

ndị eze niile nke ụwa na mba niile dị iche iche,

unu ụmụ eze na ndị niile na-achị achị nʼụwa,

ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ,

ndị okenye na ụmụntakịrị.

Ka ha niile too aha Onyenwe anyị,

nʼihi na ọ bụ naanị aha ya ka e buliri elu;

ebube ya dị ukwuu karịa eluigwe na ụwa.

O meela ka mpi1 ndị ya dị elu,

otuto ndị nsọ ya niile,

nke Izrel ndị ọ hụrụ nʼanya.

Toonu Onyenwe anyị.

Source notes (1)
  1. Footnote Mpi bụ ihe na-egosipụta ike, gụọ akwụkwọ 1Sa 2:1

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.