Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 147
Onyenwe anyị dike, na onye amara
Toonu Onyenwe anyị!
Ọ bụ ihe dị mma ịbụku Chineke anyị abụ otuto.
Ọ bụ ihe na-eweta mmasị, bụrụkwa ihe ziri ezi ito ya!
Onyenwe anyị na-ewu Jerusalem:
ọ na-akpọghachita ụmụ Izrel ndị a dọọrọ nʼagha gaa nʼala ọzọ.
Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa
na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ.
Ọ bụ ya na-ekpebi ọnụọgụgụ kpakpando niile
na-akpọkwa ha nʼotu na otu.1
Onyenwe anyị dị ukwuu, ike ya dịkwa ukwuu;
nghọta ya enweghị nsọtụ.
Onyenwe anyị na-agba ndị dị umeala nʼobi ume
ma ọ na-atụda ndị ajọ omume nʼala.
Jirinụ ekele bụkuo Onyenwe anyị abụ;
jirinụ ụbọ akwara kpọọrọ Chineke anyị egwu.
Ọ na-eji igwe ojii na-ekpuchi mbara eluigwe;
ọ na-ewetara elu ụwa mmiri ozuzo
na-eme ka ahịhịa puo nʼelu ugwu niile.
Ọ na-enye ehi niile nri
na-enyekwa ụmụ ugolọma nri mgbe ha na-ebeku ya akwa nʼihi nri.
Mmasị ya adịghị nʼike nke ịnyịnya,
maọbụ nʼike ụkwụ nke mmadụ.
Onyenwe anyị na-enwe mmasị nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,
ndị olileanya ha dị na ịhụnanya ya nke na-adịghị agharịpụ.
O Jerusalem, jaa Onyenwe anyị mma;
o Zayọn, too Chineke gị.
Nʼihi na o wusiela mkpọrọ ọnụ ụzọ ama gị niile ike,
na-agọzikwa ndị niile bi nʼime gị.
Ọ na-eme ka oke ala gị nwee udo,
jirikwa ọka wiiti kachasị mma nyejuo gị afọ.
Ọ na-ezipụ iwu ya nʼelu ụwa niile;
okwu ya na-agbasa ngwangwa.
Ọ na-atụsa snoo nʼala dịka ajị anụ,
na-efesasị igirigi snoo dịka ntụ.
Ọ na-atụdata mkpụrụ mmiri ya dị ka mkpụrụ okwute.
Onye pụrụ iguzogide oke ifufe oyi ya?
Ọ na-ezipụ okwu ya na-agbaze ha;
ọ na-akpalịte ikuku ya mee ka mmiri bido ịsọgharị.
O kpugheela okwu ya nye Jekọb,
iwu ya na ụkpụrụ ya niile nye Izrel.
O mesobeghị mba ọzọ ụdị mmeso dị otu a.
Ha amakwaghị iwu ya niile.
Toonu Onyenwe anyị!
Source notes (1)
- Footnote Aịz 40:26
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.