Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 146

Tụkwasị Chineke obi

Toonu Onyenwe anyị.

O mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị.

Aga m eto Onyenwe anyị ogologo ndụ m niile;

aga m abụ abụ otuto nye Chineke m mgbe m nọ na-adị ndụ.

Atụkwasịla ụmụ eze obi gị,

ndị bụ mmadụ efu na-apụghị ịzọpụta.

Mgbe mmụọ ha pụrụ, ha na-alaghachi nʼaja1;

nʼụbọchị ahụ, atụmatụ ha na-aghọ ihe efu.

Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye inyeaka ya bụ Chineke nke Jekọb,

onye olileanya ya dị na Onyenwe anyị, Chineke ya.

Onye kere eluigwe na ụwa,

na osimiri, na ihe niile dị nʼime ha,

Onyenwe anyị, onye ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-akpagbu

na-enyekwa ndị agụụ na-agụ nri.

Onyenwe anyị na-eme ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ nwere onwe ha,

Onyenwe anyị na-emeghe anya ndị kpuru ìsì,

Onyenwe anyị na-akwagide ndị niile dara mba,

Onyenwe anyị hụrụ ndị ezi omume niile nʼanya.

Onyenwe anyị na-echebe ndị ọbịa,

na-elekọtakwa ndị na-enweghị nna na ndị di ha nwụrụ anwụ,

ma ọ na-eme ka ihe ghara ịgara ndị ajọ omume nke ọma.

Onyenwe anyị na-achị ruo ebighị ebi,

Chineke gị, o Zayọn, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Toonu Onyenwe anyị.

Source notes (1)
  1. Footnote Ekl 12:7

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.