Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Ilu 1

Ihe mere e ji dee Ilu

Ndị a bụ ilu Solomọn nwa Devid, eze Izrel.

Ọ bụ maka amamihe na ntụziaka,

maka ịghọta okwu niile kwesiri ịghọta nke ọma,

nʼihi inweta ntụziaka nʼinwe uche,

ime ezi omume na ikpe ziri ezi nke aghụghọ na-adịghị.

Nʼihi ime ka ndị na-enweghị uche nwee ezi uche,

ka ndị na-eto eto nweta ihe ọmụma na izuzu ọma.

Ka onye maara ihe gee ntị, tụkwasịkwa ihe nʼihe ọ maara,

ka ndị nwere nghọta nwetakwa ezi ndụmọdụ.

Ka ha ghọta ilu niile na okwu niile

na-esi nʼọnụ ndị maara ihe.

Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma.1

Ọ bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị.

Okwu mmalite: Nkwado maka ịnabata amamihe

Ịdọ aka na ntị banyere ndị nrafu

Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị

ahapụkwala ndụmọdụ nne gị.

Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị,

bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị.

Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie ara gị ụra,

ekwenyerela ha, Ekwela!2

Ọ bụrụ na ha asị gị, “Bịa soro anyị; ka anyị zoo onwe anyị,

tigbuo onye ọbụla anyị hụrụ,

bụ onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.

Ka anyị loo ha na ndụ, dịka ala ili,

loo ha kpamkpam dịka ndị na-arịda nʼolulu.

Anyị ga-enwetakwa ọtụtụ ihe dị oke ọnụahịa,

nke anyị ga-akwaju nʼụlọ anyị.

Soro anyị fee nza gị ka anyị nwaa ike anyị,

ihe ọbụla kwa anyị nwetara, anyị na gị ga-ekekọta ya ọnụ.”

Nwa m, ejela ije nʼụzọ ndị dị otu a,

a zọọkwala ụkwụ nʼokporoụzọ ha;

nʼihi na ụkwụ ha na-agba ọsọ ime ihe ọjọọ,

na-emekwa ngwangwa iwufu ọbara.

Ọ bụ ihe abaghị uru ịgbasa ụgbụ,

nʼebe nnụnụ ọbụla na-ahụ ya anya.

Ma ndị a na-esi ọnya nke na-ama ha.

Ha onwe ha ka ọnya ahụ ga-ejide.

Otu a ka ọ na-adịkwara ndị ọ na-agụsị agụụ ike inweta akụnụba nʼụzọ na-ezighị ezi.

Nʼihi na ịgbaso ụzọ dị otu a na-ewetara ndị na-eso ya ọnwụ.

Jidesie amamihe aka ike

Amamihe na-eti mkpu nʼezi ka mmadụ nụ.

Olu ya na-ada ụda nʼama.

Ọ bụ nʼisi akụkụ ụzọ nke mkpọtụ dịkarịsịrị ka ọ na-akpọ oku,

nʼọnụ ụzọ ama obodo ka ọ na-anọ ekwupụta okwu ọnụ ya niile.

“Unu ndị na-enweghị uche ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide bụrụ ndị ga-ahụ enweghị uche nʼanya?

Ruo ole mgbe ka ndị na-akwa emo ga-anọgide na mmasị ịkwa emo?

Ruo ole mgbe ka ndị nzuzu ga-anọgide na-akpọ ihe ọmụma asị?

Ọ bụrụ na unu gere ntị na mba m na-abara unu,

aga m awụpụ echiche niile nke obi m nye unu,

aga m emekwa ka unu mara okwu m.

Ma ebe ọ bụ na unu egeghị ntị mgbe m kpọrọ oku,

setịpụkwa aka m nye unu ma ọ dịghị onye ṅara ntị,

ebe ọ bụ na unu akpọla ndụmọdụ m asị,

jụkwa ịnabata ịba mba m nye unu,

ụbọchị unu ga-adaba na mmekpa ahụ, aga m achị ọchị.

Mgbe ihe egwu bịakwasịrị unu, aga m akwa unu emo.

Mgbe oke ihe egwu ga-abịakwasị unu dịka ikuku dị ike,

mgbe nhụju anya ga-erubiga nʼelu unu dịka oke ifufe,

mgbe ịta ahụhụ na nsogbu ga-agbagwoju unu anya.

“Agaghị m ege ntị nʼakwa unu, ọ bụ ezie na unu ga na-akpọ m.

Unu ga-achọkwa m ma unu agaghị achọta m.

Nʼihi na unu mechiri anya unu nʼebe ihe ọmụma dị,

unu atụghị egwu Onyenwe anyị.

Unu aṅaghị ntị na ndụmọdụ m.

Unu lelịrị ịba mba m anya.

Ihe niile unu kụrụ ka unu ga-aghọta.

Ọ bụkwa ụzọ unu na ndụmọdụ unu ga-eju unu afọ.

Nʼihi na ejezighị ije nke ndị na-enweghị uche na-egbu ha,

ọ bụkwa ọnọdụ afọ ojuju ndị nzuzu ga-alakwa ha nʼiyi.

Ma onye na-ege ntị nʼokwu m ga-ebi obi ntụkwasị obi.

Ọ ga-anọ jụụ na-enweghị ihe ọbụla ga-atụ ya egwu.”

Source notes (2)
  1. Footnote Ilu 9:10; Ilu 15:33; Ekl 12:13
  2. Footnote Jen 39:7-10; Dit 13:8; Efe 5:11.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.