Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Ilu 2

Ịba uru nke amamihe

Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata okwu ọnụ m niile

zobekwa iwu m niile nʼime obi gị,

tọọ ntị gị nʼala nye amamihe,

wepụta obi gị inwe nghọta.

E, ọ bụrụ na ọ bụ ihe ọmụma ka ị na-akpọku,

ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta ka ị na-eweliri olu gị,

ọ bụrụ na ị na-achọ ya dịka i si achọ ọlaọcha

maọbụ akụ nke zoro ezo,

mgbe ahụ, ị ga-aghọtakwa ihe bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị

chọtakwa ihe ọmụma nke Chineke.

Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-enye amamihe;

nʼebe ọ nọ ka nghọta na ihe ọmụma na-esi abịa.1

Ọ na-edebere ndị ụzọ ha ziri ezi nzube ọganihu,

ọ bụ ọta nye ndị na-eje ije nʼizuoke.

Ọ na-echebekwa ụzọ nke ndị na-eme ezi ihe na-agbaso,

na-elekọtakwa ụzọ nke ndị hụrụ ya nʼanya na-agbaso.

Mgbe ahụ ka ị ga-aghọta ihe ziri ezi

na ihe dị mma na ezi ụzọ niile.

Nʼihi na amamihe ga-enwe ọnọdụ nʼime obi gị,

ihe ọmụma ga-adịkwa mkpụrụobi gị ụtọ.

Izuzu zuruoke ga-echebe gị,

nghọta ga na-eche gị nche.

Amamihe ga-azọpụta gị site nʼụzọ ndị mmehie,

sitekwa na mmadụ ndị okwu ha jọrọ njọ,

ndị hapụrụ ụzọ niile ziri ezi nke Chineke

na-agbaso ụzọ niile nke ọchịchịrị,

ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ,

nʼihi na mmehie ha na-atọ ha ụtọ.

Ihe ọbụla ha na-eme gbagọrọ agbagọ,

jọọkwa njọ.

Ọ bụ naanị amamihe ga-anapụta gị nʼaka nwanyị akwụna,

na nwanyị na-abụghị nwunye gị nke na-ekwu okwu nrafu.

Onye na-ahapụ di ọ lụrụ nʼagbọghọ,

nke chefuru ọgbụgba ndụ ọ gbara nʼihu Chineke.

Ụlọ nwanyị dị otu a dị nʼokporoụzọ

nke na-eduba nʼọnwụ na nʼọkụ ala mmụọ.

Ndị ikom niile banyere nʼụlọ ha na-ala nʼiyi.

Ha adịghị alọtakwa nʼokporoụzọ nke na-eduba na ndụ.

Nʼihi nke a, ị ga-aga ije nʼụzọ ndị ezi omume,

debekwa ụkwụ gị nʼokporoụzọ niile nke ndị ezi omume,

nʼihi na ọ bụ naanị ndị ziri ezi ga-ebi nʼala ahụ,

ndị na-enweghị ịta ụta ga-afọdụkwa nʼime ya.

Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ site nʼala ahụ,

ọ bụkwa ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi ka a ga-ewezuga na ya.

Source notes (1)
  1. Footnote 1Ez 3:9,12; Job 32:8; Jem 1:5.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.