Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 97

Chineke onye na-achị ihe niile

Onyenwe anyị bụ eze,1 ka ụwa niile nwee obi ụtọ;

ka ndị niile bi nʼebe dị anya ṅụrịa.

Igwe ojii na oke ọchịchịrị gbara ya gburugburu;

ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala ocheeze ya.

Ọkụ na-enwu enwu na-aga nʼihu ya

ọ na-erepịasị ndị iro ya nʼakụkụ ya ọbụla.

Amụma ya na-acha chazuo elu ụwa niile;

ụwa niile na-ahụ ya na-ama jijiji.

Ugwu niile na-agbaze dịka mmanụ nʼihu Onyenwe anyị,

nʼihu Onyenwe ụwa niile.

Eluigwe na-ekwuwapụta ezi omume ya;

ndị niile bi nʼụwa na-ahụkwa ebube ya.

A na-eme ka ihere mee ndị niile na-efe arụsị niile a pịrị apị ofufe,

ndị na-anya isi na chi niile e jiri aka mee

feenụ ya ofufe, unu chi niile!

Zayọn na-anụ ma na-aṅụrịkwa ọṅụ,

obodo nta niile nke Juda na-enwekwa obi ụtọ

nʼihi ikpe gị, O Onyenwe anyị.

Nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile;

ị bụ onye e buliri elu karịa chi ndị ọzọ niile.

Ka unu, ndị hụrụ Onyenwe anyị nʼanya, kpọọ ihe ọjọọ asị,

nʼihi na ọ na-echebe ndụ ndị nke ya, ndị tụkwasịrị ya obi

ma na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume.

Ìhè na-amụkwasị onye ezi omume,

ọṅụ na-adịkwa nʼime obi onye na-eme ihe ziri ezi.

Ṅụrịanụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume,

tookwanụ aha nsọ ya.

Source notes (1)
  1. Footnote Abụ 96:10; Abụ 99:1

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.