Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 98
Abụ Ọma.
Toonu Onyenwe anyị onye ezi omume
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ,1
nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube;
aka nri ya na aka nsọ ya
arụpụtarala ya nzọpụta.
Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya
o kpugheela ezi omume ya nye mba niile.
O chetala ịhụnanya ya
na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị;
nsọtụ nke ụwa niile ahụla
nzọpụta Chineke anyị.
Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile
jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ;
werenụ ụbọ akwara bụkuo Onyenwe anyị abụ,
e, were ụbọ akwara na olu abụ ọma,
jirinụ opi na opi ike,
tisie mkpu ọṅụ ike nʼihu Onyenwe anyị, Onye bụ Eze.
Ka oke osimiri niile gbọọ ụja, ya na ihe niile dị nʼime ya,
ụwa na ndị niile bi nʼime ya.
Ka osimiri na iyi niile kụọ aka ha,
ka ugwu niile bụkuokwa ya abụ nʼihi ọṅụ;
ka ha bụọ abụ nʼihu Onyenwe anyị,
nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe.
Ọ ga-eji ezi omume kpee ụwa ikpe.
Ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.
Source notes (1)
- Footnote Abụ 96:1
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.