Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 96

Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị

Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ,

bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ụwa niile.

Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, toonu aha ya;

kwupụtanụ nzọpụta ya site nʼotu ụbọchị ruo nʼụbọchị nke ọzọ.

Kwusaanụ ebube ya nʼetiti mba niile,

kọsakwanụ banyere oke ọrụ ya niile nʼetiti ndị niile dị iche iche.

Nʼihi na Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto;

onye a na-atụ egwu karịa chi ọzọ niile ka ọ bụkwa.

Nʼihi na chi niile nke mba niile dị iche iche bụ arụsị efu,

maọbụ Onyenwe anyị kere eluigwe niile.

Ịma mma na ebube dị nʼihu ya;

ike na otuto dị nʼebe nsọ ya.

Nyenụ Onyenwe anyị, unu ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche,

nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ na ike.

Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya;

werenụ onyinye bata nʼime ogige ya.

Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya;

maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile.

Kwusaa nʼetiti mba niile sị, “Onyenwe anyị na-achị.”

Elu ụwa kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya;

ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.

Ka mbara eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ;

ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya.

Ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ.

Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ nʼihi ọṅụ.

Ka ihe niile e kere eke ṅụrịa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa,

ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe.

Ọ ga-eji ezi omume kpee elu ụwa ikpe,

jirikwa ikwesi ntụkwasị obi kpee ndị niile dị iche iche ikpe.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.