Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 95

Toonu Onyenwe anyị

Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo Onyenwe anyị abụ;

ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ.

Ka anyị jiri ekele bịakwute ya

jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma.

Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke dị ukwuu,

eze ukwuu kachasị chi niile elu.

Ebe niile michasịrị emi nke ụwa dị nʼaka ya,

ebe kachasị elu nke ugwu niile bụkwa nke ya.

Osimiri niile bụ nke ya, nʼihi na ọ bụ ya kere ha,

aka ya kpụrụ ala akọrọ niile.

Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe,

ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu Onyenwe anyị, onye kere anyị;

nʼihi na ọ bụ Chineke anyị

anyị bụkwa ndị ọ na-azụ dịka atụrụ,

igwe atụrụ ọ na-elekọta anya.

Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya,

“Unu emela ka obi unu sie ike dịka unu mere na Meriba,

maọbụ dịka unu mere nʼụbọchị ahụ na Masa nʼime ọzara,

ebe nna nna unu ha nwara m,

nʼagbanyeghị na ha hụrụ ihe niile m mere.

Iri afọ anọ ka m were iwe megide ọgbọ ahụ;

ekwuru m sị, ‘Ndị a bụ ndị obi ha na-akpafu akpafu site nʼebe m nọ,

ha amatabeghị ụzọ m niile.’

Nʼihi nke a, aṅụrụ m iyi nʼiwe, sị,

‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ”

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.