Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 76

Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ.

Ike mmeri nke Chineke

A maara Chineke nʼobodo Juda;

aha ya dị ukwuu nʼobodo Izrel.

Ụlọ ikwu ya dị na Salem,

ebe obibi ya dị na Zayọn

Ebe ahụ ka o tijisịrị àkụ niile na-egbu amụma,

na ọta niile, na mma agha niile, na ngwa agha niile. Sela

Ị jupụtara nʼìhè,

ị dị oke ebube karịa ọtụtụ ugwu nke anụmanụ jupụtara.

A pụnarịla ndị nwere obi ike ihe ha,

ha na-arahụkwa ụra ikpeazụ ha;

o nweghị otu onye nʼime ndị dike nʼagha ndị a

pụrụ iweli aka ya abụọ elu.

Nʼihi ịba mba gị, O Chineke nke Jekọb,

ịnyịnya na ụgbọ agha na-anọ juu.1

Ọ bụ naanị gị ka e kwesiri ịtụ egwu.

Onye pụrụ iguzo nʼihu gị mgbe i na-ewe iwe?

I sitere nʼeluigwe mee ka a nụ olu ikpe ikpe gị.

Ụwa tụkwara egwu, dere duu,

mgbe gị, O Chineke, biliri ikpe ikpe,

ịzọpụta ndị niile a na-akpagbu nʼala a. Sela

Nʼezie, oke iwe gị megide ụmụ mmadụ na-ewetara gị otuto,2

ndị fọdụrụ mgbe oke iwe gị gabigasịrị, na-anọ juu.

Kwenụ Onyenwe anyị Chineke nkwa ma mezuokwa ha;

ka ndị ala niile bụ agbataobi unu

wetara onye ahụ e kwesiri ịtụ egwu onyinye dị iche iche.

Ọ na-eweda ndị na-achị achị nʼala;

ndị eze niile nke ụwa na-atụ ya egwu.

Source notes (2)
  1. Footnote Ọpụ 15:1-6
  2. Footnote Ọpụ 9:16-18; Rom 9:17

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.