Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 77
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Maka Jedutun. Abụ nke Asaf. Abụ Ọma.
Nkasiobi nʼoge nsogbu
Etikuru m Chineke nʼoke olu maka enyemaka;
etikuru m Chineke mkpu ka ọ nụrụ olu m.
Mgbe m nọ nʼihe mgbu, ọ bụ Onyenwe anyị ka m chọrọ.
Nʼanyasị, esetipụrụ m aka m abụọ, ike na-agwụghị,
mmụọ m jụkwara ka a akasịe ya obi.
O Chineke, echetara m gị, sụkwaa ude;
echere m echiche, mkpụrụobi m dakwara mba. Sela
I kweghị ka anya m abụọ mechie;
nʼihi oke mwute m, enweghị m ike kwuo okwu.
Echere m echiche banyere ụbọchị niile gara aga,
na afọ niile ndị gara aga.
Echetara m abụ niile m na-abụ nʼime anyasị.
Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ntụgharị uche, mmụọ m jụkwara ajụjụ.
“Onyenwe anyị ọ ga-agbakụta m azụ ruo mgbe ebighị ebi?
Ọ pụtara na ọ gaghị egosi ihuọma ya ọzọ?
Ọ pụtara na ịhụnanya ya nke na-adịgide ruo ebighị ebi agwụla?
Ọ pụtara na nkwa ya agaghị emezu ruo ebighị ebi?
Chineke, o chefuola i mere anyị ebere?
O jichiela ọmịiko ya nʼihi iwe?” Sela
Mgbe ahụ, ekwuru m, “Lee ọnọdụ ọjọọ m,
afọ niile mgbe Onye kachasị ihe niile elu setịpụrụ aka nri ya.
Aga m echeta ọrụ niile Onyenwe anyị rụrụ;
e, aga m echeta ihe ịrịbama niile i mere nʼoge gara aga.
Aga m atụgharịa uche m nʼọrụ gị niile,
tuleekwa ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.”
O Chineke, ụzọ gị niile dị nsọ.
Olee chi dị ukwuu dịka Chineke anyị?
Ị bụ Chineke onye na-arụ ọrụ ebube dị iche iche;
ị na-egosipụta ike gị nʼetiti ụmụ mmadụ.
I ji aka gị dị ike gbapụta ndị gị,
bụ ụmụ ụmụ Jekọb na Josef. Sela
Osimiri hụrụ gị, O Chineke,
osimiri hụrụ gị, taa;
ogbu mmiri mere mkpọtụ.
Igwe ojii wụpụrụ mmiri,
mkpọtụ egbe eluigwe jupụtara mbara eluigwe;
àkụ gị gburu amụma ebe niile.
A nụrụ ụda egbe eluigwe gị nʼoke ifufe,
amụma gị nyere ụwa niile ihe;
elu ụwa niile mara jijiji, tụkwaa oke egwu.
Ọ bụ nʼosimiri ka nzọ ụkwụ gị gara,
ụzọ gị gara nʼetiti oke osimiri,
ọ bụ ezie na ahụghị m nzọ ụkwụ gị anya.
I sitere nʼaka Mosis na Erọn
duo ndị gị dịka igwe atụrụ.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.