Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 75

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala.” Abụ Ọma Asaf. Otu Abụ.

Ikpe ikpe ziri ezi nke Chineke

Anyị na-eto gị, O Chineke.

Anyị na-eto gị, nʼihi na aha gị dị nso.

Ndị mmadụ na-ekwu banyere ọrụ ebube gị dị iche iche.

Ị na-asị, “Ana m ahọpụta oge a kara aka.

Ọ bụ m na-ekpe ikpe ziri ezi.

Mgbe ụwa na mmadụ niile bi nʼime ya na-ama jijiji,

ọ bụ m na-ejidesi ogidi1 ya ike ka o guzo chịm. Sela

Nye ndị mpako, ana m asị, ‘Unu etukwala ọnụ ọzọ,

nye ndị ajọ omume, ana m asị, Unu ewelila mpi2 unu elu.

Unu ewelila mpi unu megide eluigwe;

unu ejila nnupu isi kwuo okwu.’ ”

Ọ dịghị onye ọbụla sitere nʼọwụwa anyanwụ, maọbụ nʼọdịda anyanwụ,

maọbụ nʼọzara nke pụrụ ibuli mmadụ elu.

Kama ọ bụ Chineke, onye na-ekpe ikpe;

ọ na-eweli otu onye elu, wedakwa onye ọzọ ala.

Otu iko dị nʼaka Onyenwe anyị

nke jupụtara na mmanya na-agba ụfụfụ nke a gwanyekọtara ụda dị iche iche.

Ọ na-awụpụ ya, ndị ajọ omume niile nke ụwa

na-aṅụ ya ruo mgbe ọ gwụsịrị.

Ma mụ onwe m, aga m ekwupụta nke a ruo mgbe ebighị ebi.

Aga m abụku Chineke nke Jekọb abụ otuto,

bụ onye sịrị, “Aga m ebipụ mpi ndị ajọ omume niile,

ma a ga-ebuli mpi ndị ezi omume elu.”

Source notes (2)
  1. Footnote Ya bụ, ntọala
  2. Footnote Mpi na-anọchite anya ike nʼebe a

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.