Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 72
Abụ nke Solomọn.
Ekpere maka eze
O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze.
Nyekwa nwa eze ezi omume gị.
Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị,
jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu.
Ka ugwu niile wetara ndị mmadụ ịba ụba;
ugwu nta niile wetakwara ha mkpụrụ ezi omume.
Ọ ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ,
zọpụtakwa ụmụntakịrị ndị nọ na mkpa;
ọ ga-egwepịa onye mmegbu.
Ka ọ dịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ na-adịgide,
dịka ọnwa na-adịgidekwa ruo ọgbọ niile.
Ọ ga-adị ka mmiri na-ezokwasị ala ubi a sụrụ asụ,
dịka mmiri ozuzo na-ede elu ala.
Nʼoge ndụ ya, ka ndị ezi omume too, na-awasa;
ịba ụba ga-ejupụta ebe niile ruo mgbe ọnwa agaghị adịkwa.
Ọ ga-achị site nʼosimiri ruo osimiri,
na-esite nʼiyi ukwu.1 ruo na nsọtụ niile nke ụwa2
Ebo niile ndị bi nʼọzara ga-akpọ isiala nye ya,
ndị iro ya niile ga-abụ ndị e wedara nʼala.
Ndị eze Tashish3 na mba niile dị nʼebe dị anya,
ga-atụ ụtụ wetara ya;
e, ọ bụladị ndị eze si Sheba na Seba,4
ga-ewetara ya ọtụtụ onyinye.
Ndị eze niile ga-akpọ isiala nye ya,
mba niile ga-ejekwara ya ozi.
Nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa mgbe ha kpọkuru ya.
Ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye na-enweghị onye ga-enyere ha aka.
Ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa,
ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa site nʼọnwụ.
Ọ ga-azọpụta ha site na mkpagbu na ihe ike,
nʼihi na ndụ ha dị oke ọnụahịa nʼanya ya.
Ka ọ dị ogologo ndụ!
Ka e nye ya ọlaọcha e wetara na Sheba.
Ka ndị mmadụ na-ekpere ya ekpere mgbe niile,
ma gọziekwa ya ogologo ụbọchị niile.
Ka mkpụrụ ọka jupụta nʼebe niile nʼala a;
ka ha na-efufegharị nʼelu ugwu niile.
Ka mkpụrụ ubi ya wasaa dịka Lebanọn;
ka mmadụ jupụta nke ọma nʼobodo dịka ahịhịa ndụ nke ọhịa.
Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;
ka ọ na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide.
A ga-esite na ya gọzie mba niile,
a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi.
Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke, Chineke nke Izrel,
onye naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche.
Otuto dịrị aha ya dị ebube ruo ebighị ebi;
ka ụwa niile jupụta nʼebube ya.
Amen na Amen.
Nke a bụ ọgwụgwụ ekpere Devid nwa Jesi.
Source notes (4)
- Footnote Nke a na-ekwu banyere osimiri Yufretis. Mgbe Solomọn na-achị, ọ bụ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala Izrel ka ọ dị. Ọ bụ otu ihe e kwere ndị Izrel na nkwa mgbe ha si nʼọnọdụ ohu na-ahapụ Ijipt. Ọpụ 23:31; Zek 9:10
- Footnote Ọ bụ site nʼosimiri Mediterenịa ruo nʼosimiri Nwụrụ anwụ, ka a maara dị ka nsọtụ ụwa nʼoge ahụ.
- Footnote Obodo Tashish dị nʼala Spen, ọ nọchiri anya nsọtụ nke ụwa, 2Ih 9:21
- Footnote Ala Sheba dị nʼArebịa, ebe ala Seba dị nʼAfrika.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.