Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 73
Nchịkọta Akwụkwọ nke atọ
Abụ Ọma 73–89
Abụ Ọma Asaf.
Ọgwụgwụ nke ndị na-emebi iwu
Nʼezie, Chineke dịịrị Izrel mma,
dịkwara ndị obi ha dị ọcha.
Ma mụ onwe m, ọ fọdụrụ nwantịị ka m zọhie ụkwụ,
ọ fọdụrụ nwantịị ka ụkwụ m gbụchapụ.
Nʼihi na e kwosara m ndị mpako ekworo1;
mgbe m hụrụ ịba ụba2 nke ndị ajọ omume.3
Ha anaghị adọgbu onwe ha;
ahụ ha gbara abụba, siekwa ike.
Nsogbu niile mmadụ ibe ha na-enwe adịghị erute ha.
Ha enweghị mkpa ọbụla nke na-akpa ha dịka ndị ọzọ nwere.
Nʼihi nke a, nganga bụ ihe ịnya nʼolu ha;
ha jikwa ihe ike kpuchie onwe ha dịka uwe.
Mmehie na-esite nʼobi ọjọọ ha apụta;
echiche ọjọọ ha enweghị ngụta.
Ha na-akwa emo, na-ejikwa iro ekwu okwu;
nʼime mpako ha, ha na-aba mba imegbu ndị ọzọ.
Ha ji ọnụ ha na-ekwu na eluigwe bụ nke ha,
ha jikwa ire ha kwuo na ụwa niile bụ nke ha.
Nʼihi nke a, ndị ha na-eso ha,
na-aṅụrụ okwu ha ebe ọ bara ụba dịka mmiri.
Ha na-asị, “Olee otu Chineke ga-esi mara?
Ọ dịkwanụ ihe Onye kachasị ihe niile elu maara?”
Otu a ka ndị ajọ omume dị,
ha na-ebi ndụ na-enweghị nsogbu; akụnụba ha na-amụbakwa.
Nʼezie, ọ bụ naanị nʼefu ka m debere obi m ọcha,
nʼefu ka m kwọrọ aka4 m abụọ nʼemeghị ihe ọjọọ.
Ogologo ụbọchị niile, anọ m na nsogbu;
ụtụtụ niile ka m na-anata ntaramahụhụ.
Ọ bụrụ na m kwuru sị, “Nke a ka m ga-ekwu,”
agaara m abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼetiti ụmụ gị.
Mgbe m gbalịrị ịghọta ihe ndị a niile,
ọ ghọọrọ m ihe mwute,
tutu ruo mgbe m bara nʼebe nsọ Chineke;
mgbe ahụ ka m ghọtara ihe ga-eme ha nʼikpeazụ.
Nʼezie, ị na-eguzo ha nʼala na-achị achị;
ị na-atụda ha, laa ha nʼiyi.
Lee, ka ha si laa nʼiyi nʼotu ntabi anya,
bụrụ ndị ihe egwu dị iche iche kpochapụrụ kpamkpam!
Dịka nrọ, mgbe mmadụ na-eteta,
otu a, O Onyenwe anyị, mgbe i tetara,
ị ga-eleda ha anya dịka echiche na-agaghị emezu.
Mgbe m nọ nʼobi mwute;
mmụọ m dara mba.
Abụ m onye nzuzu na onye na-amaghị ihe.
Adị m ka anụ ọhịa nʼihu gị.
Ma ana m anọnyere gị mgbe niile;
ị na-ejide m nʼaka nri m.
Ị na-eji ndụmọdụ gị na-edu m,
ma emesịa, ị ga-anabata m nʼebube gị.
Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị?
Ọ dịghị ihe ụwa a nwere nke m ga-achọsi ike karịa gị.
Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba,
ma Chineke bụ ike nke obi m,
na ihe nketa m ruo ebighị ebi.
Ndị niile nọpụrụ gị nʼebe dị anya ga-ala nʼiyi.
Ị ga-alakwa ndị niile na-ekwesighị ntụkwasị obi, nye gị nʼiyi.
Ma nye mụ onwe m, ọ dị mma ịnọ Chineke nso.
Emeela m Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ebe mgbaba m.
Aga m akọ banyere ọrụ gị niile dị iche iche.
Source notes (4)
- Footnote Abụ 37:1,7; Ilu 23:17
- Footnote Maọbụ, udo
- Footnote Job 21:5-16; Jer 12:1
- Footnote Biri ndụ na-enweghị ntụpọ
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.