Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 71

Ekpere maka ndụ ogologo

Onyenwe anyị, nʼime gị ka m gbabara izere ndụ;

ekwela ka ihere mee m.

Site nʼezi omume gị, gbapụta m, mee ka m nwere onwe m;

tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m ma zọpụta m.

Ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba,

ebe m nwere ike ịgbaba mgbe ọbụla;

nye iwu maka nzọpụta m,

nʼihi na ị bụ oke nkume m na ebe m e wusiri ike.

O Chineke m, site nʼaka ndị ajọ omume na ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ,

ndị afọ tara mmiri, gbapụta m.

Nʼihi na gị onwe gị bụrịị olileanya m, Onyenwe m Onyenwe anyị,

ntụkwasị obi m site na mgbe m bụ nwantakịrị.1

Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi, site nʼoge amụrụ m;

gị onwe gị wepụtara m site nʼafọ nne m.

Aga m anọgide na-eto gị.

Adịla m ka ihe ama nye ọtụtụ mmadụ,

ma ị bụ ebe mgbaba m siri ike.

Ọnụ m jupụtara nʼotuto gị,

ọ na-ekwupụta ịma mma gị ogologo ụbọchị niile.

Agbakụtala m azụ mgbe m mere agadi;

ahapụkwala m mgbe ike adịghịkwa m.

Nʼihi na ndị iro m na-ekwu okwu megide m;

ndị ahụ na-achọ igbu m na-agbarịta izu nzuzo.

Ha na-asị, “Chineke agbakụtala ya azụ;

chụọ ya ọsọ, jidekwa ya,

nʼihi na o nweghị onye ọbụla ga-agbapụta ya.”

O Chineke, anọla m ebe dị anya;

O Chineke m, bịa ngwangwa nyere m aka.

Ka e were ihere kpuchie ndị na-ebo m ebubo ụgha;

ka ihere na nleda anya bụrụ ihe ga-ekpuchi

ndị ahụ na-achọ imerụ m ahụ.

Ma mụ onwe m ga-anọgide na-enwe olileanya mgbe niile;

aga m eto gị mgbe niile karịa otu m toro gị na mbụ.

Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gị

na nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile,

ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya.

Aga m abịa kwusaakwa ịdị ukwu ọrụ gị niile, Onyenwe m Onyenwe anyị,

aga m ekwusa ezi omume gị, e, naanị nke gị.

O Chineke, site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe,

ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile.

O Chineke m, ọ bụladị mgbe m mere agadi,

mgbe isi awọ juru m isi, ahapụla m,

tutu ruo mgbe m ga-ekwupụta ike gị nye ọgbọ nke na-abịa,

na ịdị ike gị nye ndị niile na-abịa nʼoge dị nʼihu.

O Chineke, ezi omume gị na-eru nʼeluigwe,

gị onye merela ọtụtụ ihe dị ukwu.

O Chineke, onye dị ka gị?

Nʼagbanyeghị na i meela ka m gabiga ọtụtụ nsogbu

nke dị ilu,

ị ga-atụte ndụ m ọzọ;

site nʼebe dị omimi nke ụwa,

ị ga-adọkpụpụta m ọzọ.

Ị ga-eme m ka m dịrị ukwuu karịa ka m dị na mbụ.

Ị ga-akasịkwa m obi ọzọ.

O Chineke m, aga m eji ụbọ akwara too gị,

nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị;

aga m eji une bụkuo gị abụ otuto,

gị Onye nsọ nke Izrel.

Egbugbere ọnụ m ga-eti mkpu ọṅụ

mgbe m na-abụku gị abụ otuto,

mụ, onye ị gbapụtara.

Ogologo ụbọchị niile, aga m ekwupụta

ọrụ ezi omume gị niile,

nʼihi na ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ,

ka e tinyere nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara.

Source notes (1)
  1. Footnote Jer 14:8; Jer 17:7,13

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.