Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 70

Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nke Devid. Arịrịọ.

Ekpere maka nnapụta

O Chineke, gbata ọsọ bịa zọpụta m,

O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka.

Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m,

bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara.

Ka ndị ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m

laghachi azụ nʼihere.

Ka ndị ahụ na-asị m, “Ehee! Ehee!”

laghachi azụ nʼihi ihere ha.

Ma ka ndị niile na-achọ gị

ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị,

ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile,

“Onyenwe anyị dị ukwuu.”

Ma mụ onwe m bụ ogbenye na onye nọ na mkpa;

O Chineke, mee ngwangwa bịakwute m.

Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m;

O Onyenwe anyị, anọla ọdụ ịbịa.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.