Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 47
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma.
Chineke bụ eze nke ụwa
Kụọnụ aka unu, unu mba niile;
jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke kachasị ihe niile elu.
Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile.
O wedara mba niile mee ka ha nọọ nʼokpuru anyị;
ndị mmadụ niile nọ nʼokpuru ụkwụ anyị.
Ọ họpụtaara anyị ihe nketa anyị,
ihe ịnya isi nke Jekọb, onye ọ hụrụ nʼanya. Sela
Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe.
Onyenwe anyị ewerela olu opi ike rigoo.
Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto;
bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto.1
Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile.
Jirinụ abụ too ya.
Chineke bụ eze mba niile;
ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile.
Ndị niile a ma ama na mba niile ezukọtaala,
dịka ndị Chineke nke Ebraham,
nʼihi na ndị eze2 niile dị nʼụwa bụ nke Chineke;
ọ bụ onye e buliri elu nʼebe ọ dị ukwuu.
Source notes (2)
- Footnote Ngwa egwu eji mpi anụmanụ mee, a na-akpọ Shọfa, ka eji abụ abụ. Ọ bụkwa ya ka a eji akpọsa afọ ọhụrụ nye ndị mmadụ.
- Footnote Maọbụ, ọta
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.