Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 48

Otu Abụ. Abụ Ọma nke ụmụ Kora.

Abụ nke Zayọn

Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto,

nʼime obodo Chineke anyị, nʼugwu nsọ ya.

Ọ mara mma nʼịdị elu ya,

bụkwa ọṅụ elu ụwa niile.

Ugwu Zayọn, obodo eze ahụ dị ukwuu,

dịka ebe kachasị elu nke Zafọn.

Chineke nọ nʼime ebe ya e wusiri ike;

o gosila onwe ya dịka ebe mgbaba ha e wusiri ike.

Mgbe ndị eze jikọtara ndị agha ha ọnụ,

mgbe ha bịakọtara nso,

ihe ha hụrụ juru ha anya;

nʼihi oke egwu, ha gbara ọsọ.

Ahụ ọma jijiji bidoro ha nʼebe ahụ,

ihe mgbu ha dịka nke nwanyị na-achọ ịmụ nwa.

Ị lara ha nʼiyi dịka oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ

si ala ụgbọ mmiri ukwuu nke Tashish nʼiyi.

Dịka anyị nụrụ,

otu a ka anyị hụrụ,

nʼime obodo Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,

nʼime obodo Chineke anyị:

Chineke na-eme ka o guzosie ike

ruo mgbe ebighị ebi. Sela

O Chineke, nʼime ụlọnsọ ukwuu gị,

ka anyị nọ na-atụgharị uche nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ.

O Chineke, dịka aha gị,

otuto gị na-eru na nsọtụ ụwa niile;

aka nri gị jupụtara nʼezi omume.

Ugwu Zayọn na-aṅụrị ọṅụ,

obodo nta niile nke Juda nwere obi ụtọ

nʼihi ikpe gị niile.

Gaanụ Zayọn gburugburu, Jegharịa ya gburugburu,

gụọkwanụ ụlọ elu ya niile ọnụ.

Lezienụ mgbidi ya niile anya,

nyochakwaanụ ebe ya niile e wusiri ike,

ka unu nwee ike ịkọrọ

ọgbọ na-abịa nʼihu akụkọ ndị a.

Nʼihi na Chineke a, bụ Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi,

ọ ga-abụ onyendu anyị, ọ bụladị ruo nʼọgwụgwụ.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.