Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 46

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Nʼusoro olu abụ alamot. Otu Abụ.

Chineke bụ ebe mgbaba anyị

Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị,

onye inyeaka anyị ka ọ bụ nʼoge nsogbu.

Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, ọ bụladị mgbe ụwa niile na-emebi,

maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri.

Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ,

maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. Sela

Otu iyi dị nke na-asọbata na-eweta ọṅụ nʼime obodo Chineke,

nʼime ebe obibi dị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu.

Chineke bi nʼime ya, ọ gaghị ada;

Chineke ga-enyere ya aka mgbe chi bọrọ.

Mba niile na-agba aghara, alaeze niile na-adakwa;

o welitere olu ya elu, ụwa na-agbaze.

Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị;

Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. Sela

Bịa, hụrụ ihe ebube niile Onyenwe anyị mere,

lee oke ịla nʼiyi niile o webatara nʼelu ụwa.

Ọ na-eme ka agha kwụsị

ruo nsọtụ nke elu ụwa niile.

Ọ na-agbaji ụta, na-ebibi ùbe,

ma na-esu ọta1 agha niile ọkụ.

Ọ na-asị, “Nọọnụ juu! Maranụ na mụ onwe m bụ Chineke!

A ga-ebuli m elu nʼetiti mba niile,

a ga-ebulikwa m elu nʼụwa.”

Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị;

Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. Sela

Source notes (1)
  1. Footnote Maọbụ, ụgbọ agha

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.