Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 43
Arịrịọ maka enyemaka
O Chineke, kpepụta m,
kpechitere m ikpe m
nʼebe mba na-amaghị Chineke nọ;
gbapụta m site nʼaka
ndị ajọ omume na ndị aghụghọ.
Ị bụ Chineke, ebe m e wusiri ike.
Gịnị mere i ji jụ m?
Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ,
nʼihi mmegbu nke onye iro?
Zipụ ìhè gị na eziokwu gị,
ka ha duo m;
ka ha kpọbata m nʼugwu nsọ gị,
bụ ebe i bi.
Mgbe ahụ, aga m aga nʼebe ịchụ aja Chineke,
gakwuru Chineke, bụ ọṅụ m na obi ụtọ m.
Aga m eji ụbọ akwara too gị,
O Chineke, bụ Chineke m.
O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?
Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?
Nwee olileanya na Chineke,
nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ,
onye Nzọpụta m na Chineke m.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.