Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 44
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ maskil nke ụmụ Kora.
Ekpere maka mgbapụta
O Chineke, anyị anụla;
nna anyị ha agwakwala anyị
ihe ndị i mere nʼoge ha,
nʼoge gara aga.
I ji aka gị chụpụ ndị mba ọzọ,
ma kụnye nna nna anyị ha dịka osisi.
I gwepịara ndị ahụ
ma mee ka ndị nna anyị na-eto na-awasa.
Ọ bụghị site na mma agha ha ka ha ji merie nweta ala a,
ha emerighị site nʼike nke aka ha;
ọ bụ aka nri gị, aka gị,
na ìhè nke ihu gị nyere ha mmeri, nʼihi na ị hụrụ ha nʼanya.
Ị bụ eze m na Chineke m,
onye na-ekpebi na Jekọb aghaghị inwe mmeri.
Nʼihi ọ bụ naanị site nʼike gị, ya na aha gị,
ka anyị ji zọda ndị iro anyị nʼokpuru ụkwụ anyị.
Atụkwasịghị m obi m nʼụta m,
mma agha m anaghị enye m mmeri;
ma i na-enye anyị mmeri nʼebe ndị iro anyị nọ,
ị na-eme ka ihere mee ndị na-eguzogide anyị.
Nʼime Chineke ka ịnya isi anyị dị ogologo ụbọchị niile,
anyị ga-eto aha gị ruo mgbe ebighị ebi. Sela
Ma ugbu a, ị jụla anyị ma weda anyị nʼala;
ị naghị esokwa ndị agha anyị apụ ọzọ.
I mere ka anyị site nʼihu ndị iro anyị gbalaga,
i meela ka ndị na-emegide anyị were aka ike napụ anyị ihe bụ nke anyị.
Ị gbakụtara anyị azụ ka e ripịa anyị dịka atụrụ,
ma chụsasịa anyị nʼetiti mba niile.
I rere ndị gị ọnụ ala,
ihe i retara ha abaghị uru nye gị.
I meela ka anyị bụrụ nkọcha nye ndị agbataobi anyị,
anyị bụ ihe ịkwa emo na ihe ọchị nye ndị gbara anyị gburugburu.
I meela anyị ka anyị bụrụ ihe ịmaatụ ọchị nʼetiti mba niile,
ndị ọbụla hụrụ anyị na-efufe isi na mkparị.
Ogologo ụbọchị niile, ihere m dị m nʼihu,
ihere m na-ekpuchikwa m ihu,
mgbe ndị nkwulu na ndị nkọcha na-eji m eme ihe ọchị,
nʼihi onye iro, onye kpebiri ịbọ ọbọ.
Ọ bụ ezie na ihe ndị a adakwasịla anyị,
ma anyị echefubeghị gị.
Anyị enupubeghị isi nʼọgbụgba ndụ anyị na gị.
Obi anyị ahapụbeghị gị!
Anyị ahapụbekwaghị iso ụzọ gị.
Ma i gwepịara anyị mee ka anyị bụrụ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị,
jirikwa oke ọchịchịrị kpuchie anyị.
Ọ bụrụ na anyị chefuru aha Chineke anyị,
maọbụ na anyị gbasaara chi mba ọzọ aka anyị,
ọ bụ na Chineke agaraghị achọpụta ya,
ebe ọ maara ihe nzuzo niile dị nʼobi?
Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji agba mgba, ogologo ụbọchị niile.
A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu.
O, Onyenwe m teta! Gịnị mere i ji arahụ ụra?
Kpọtee onwe gị! Ajụkwala anyị ruo mgbe ebighị ebi.
Gịnị mere i ji ezopụ ihu gị,
ma chefuo mmegbu na ịta ahụhụ anyị?
E tidala anyị nʼala, nʼuzuzu,
ahụ anyị rapara nʼaja
Bilie ma nyere anyị aka;
gbapụta anyị maka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ.
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.