Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 42

Nchịkọta Akwụkwọ nke Abụọ

Abụ Ọma 42–72

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Maskil nke ụmụ Kora.

Iru ụjụ na nkasiobi onye ezi omume

Dịka agụụ ịṅụ mmiri si na-agụ nne ele,

otu a ka agụụ ihe banyere gị si na-agụ m, O Chineke.

Akpịrị nke ihe banyere Chineke, bụ Chineke ahụ dị ndụ, na-akpọ m nkụ.

Olee mgbe m pụrụ ịga zute Chineke?

Anya mmiri m aghọọlara m ihe oriri

nʼehihie ma nʼabalị,

mgbe ndị mmadụ na-asị m ogologo ụbọchị niile,

“Olee ebe Chineke gị nọ?”

Ihe ndị a ka m na-echeta

mgbe m na-ekwupụta ihe mgbu nke obi m:

ma m cheta mgbe mụ na igwe mmadụ so aga,

mgbe m ji iti mkpu ọṅụ na ekele na-edu ha

nʼetiti ọha kachasị ibe ya, ndị ọṅụ juru obi,

na-aga nʼụlọ Chineke.

O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?

Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?

Nwee olileanya na Chineke,

nʼihi na m ka ga-eto ya,

Onye nzọpụta m na Chineke m.

Mkpụrụobi m na-ada mba nʼime m;

ya mere, aga m echeta gị

site nʼala Jọdan,

na ebe dị elu nke Hemon,1 na sitekwa nʼugwu Miza.

Ogbu mmiri na-akpọku ogbu mmiri

mgbe olu ha na-ada ụda nʼetiti nruda mmiri gị niile;

ebili mmiri gị niile na mmali mmiri gị niile

ekpuchiela isi m.

Nʼehihie, Onyenwe anyị na-awụkwasị m ịhụnanya ya,

nʼabalị abụ ya dị m nʼobi,

ekpere nye Chineke nke ndụ m.

Ana m asị Chineke, oke nkume m,

“Gịnị mere i ji chefuo m?

Gịnị mere m ga-eji na-ejegharị nʼiru ụjụ

nʼihi mmegbu nke onye iro?”

Ọkpụkpụ m na-agabiga oke ihe mgbu,

mgbe ndị iro m ji m na-eme ihe ọchị,

ogologo ụbọchị niile ha na-ajụ m,

“Olee ebe Chineke gị nọ?”

O mkpụrụobi m, gịnị mere i ji daa mba?

Gịnị mere i ji na-asụ ude nʼime m?

Nwee olileanya na Chineke,

nʼihi na m ka ga-eto ya ọzọ,

Onye nzọpụta m na Chineke m.

Source notes (1)
  1. Footnote Hemon bụ obodo dị nʼoke ala nkwa ahụ nʼebe ugwu.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.