Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 41

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.

Ekpere onye ọrịa

Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ ndị nwere uche na-eleta ndị ogbenye;

Onyenwe anyị na-azọpụta ha nʼoge nsogbu.

Onyenwe anyị ga-echebe ha, debekwa ha ndụ;

ọ ga-eme ka ihe na-agara ha nke ọma nʼala ahụ,

ọ gaghị arara ha nye nʼọchịchọ ndị iro ha.

Onyenwe anyị na-elekọta ha mgbe ahụ na-esighị ha ike,

meekwa ka ahụ dị ha mma.

Ekwuru m sị, “O Onyenwe anyị, meere m ebere;

gwọọ m, nʼihi na emehiela m megide gị.”

Ndị iro m na-esite nʼiro ha ekwu okwu megide m

na-asị, “Olee mgbe ọ ga-anwụ ka aha ya laa nʼiyi?”

Mgbe otu nʼime ha bịara ịhụ m,

ọ na-ekwu okwu ụgha, ma obi ya na-achịkọta ihe nkwulu;

mgbe ahụ ọ na-apụ, ga kọsaa ya.

Ndị niile kpọrọ m asị na-agbarịta izu megide m;

ha na-echekwa echiche ọjọọ banyere m, na-asịrịta onwe ha:

“Ọrịa ọjọọ adakwasịla ya;

ọ gaghị esite na ihe ndina ya bilie ọtọ ọzọ.”

Ọ bụladị ezigbo enyi m,

onye m tụkwasịrị obi,

onye mụ na ya na-eso erikọ nri m,

ebiliela imegide m.

Ma gị, O Onyenwe anyị, meere m ebere,

mee ka ahụ sie m ike ọzọ, ka m nwee ike kwụghachi ha ụgwọ.

Amaara m na ihe banyere m na-atọ gị ụtọ nʼobi,

nʼihi na i kwebeghị ka ndị iro m nwee mmeri nʼebe m nọ.

Nʼihi ikwesi ntụkwasị obi m, ị na-akwagide m,

mee ka m nọrọ nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi.

Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel,

site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.

Amen na Amen.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.