Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 40

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.

Abụ ekele

Eji m ndidi chere Onyenwe anyị,

ọ tụgharịkwutere m, ọ nụkwaara akwa m.

O sitere nʼolulu na-amị amị,

nke apịtị na ụrọ juru, sepụta m;

o guzobere ụkwụ m abụọ nʼelu oke nkume,

nyekwa m ebe siri ike ka m guzo.

O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m,

abụ otuto nye Chineke anyị.

Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu,

ha ga-atụkwasị obi ha nʼime Onyenwe anyị.

Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ,

onye na-eme Onyenwe anyị ebe ntụkwasị obi ya;

onye na-adịghị ele ndị mpako anya

maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị.1

O Onyenwe anyị Chineke m,

ọrụ ebube ị rụrụ dị ọtụtụ,

ọ dịghị onye pụrụ ịgụkọta ihe niile

ị kwadooro maka inye anyị;

a sịkwarị na aga m ekwu ma kọsaa ihe banyere ha,

ha karịrị ihe ọnụ pụrụ ikwu.

Aja na onyinye2 abụghị ihe ị chọrọ

ma ị megheela ntị abụọ;

aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ.

Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Lee m, abịala m,

e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.

O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ,

iwu gị dị nʼime obi m.”

Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi;

dịka ị maara, o Onyenwe anyị,

anaghị m emechi ọnụ m.

Ekpuchighị m ezi omume gị nʼime obi m,

ana m ekwupụta maka ikwesi ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị.

Adịghị m ekpuchi ịhụnanya na eziokwu gị,

nʼebe ọgbakọ ukwuu nọ.

O Onyenwe anyị, ezonarịla m ebere gị,

ka ịhụnanya gị na eziokwu gị chebe m oge niile.

Nʼihi na ọtụtụ nsogbu a na-apụghị ịgụta ọnụ gbara m gburugburu;

mmehie m niile akarịala m, apụghịkwa m ịhụ ụzọ:

ha karịrị agịrị isi dị m nʼisi,

obi m na-adakwa mba nʼime m.

O Onyenwe anyị, ya masị gị ịzọpụta m;

O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka.

Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m,

bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara;

ka ndị niile ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m,

laghachi azụ nʼihere.

Ka ndị ahụ na-asị m,

“Ehee! Ehee!” kụja nʼihi ihere onwe ha.

Ma ka ndị niile na-achọ gị

ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị;

ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile,

“Onyenwe anyị dị ukwuu.”

Ma mụ onwe m bụ m ogbenye na onye nọ na mkpa;

ka Onyenwe anyị cheta m.

Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m;

Ị bụ Chineke m, anọla ọdụ ịbịa.

Source notes (2)
  1. Footnote Maọbụ, gbasoo okwu ụgha
  2. Footnote 1Sa 15:22; Abụ 51:16-17; Aịz 1:11; Jer 7:22-23; Mai 6:6-8; Hib 10:5-9

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.