Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 39
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ maka Jedutun. Abụ Ọma Devid.
Nkwupụta mmehie
Asịrị m, “Aga m elezi anya nʼụzọ m niile
ma debe ire m ka m ghara ikwuhie1;
aga m eji ihe kechie ọnụ m
mgbe m nọ nʼetiti ndị ajọ omume.”
Ma mgbe m mechiri ọnụ m ma nọrọ duu,
jụ ikwu ọ bụladị ihe ọbụla dị mma,
oke ihe mgbu m mụbara.
Obi m kporo ọkụ nʼime m,
ma mgbe m na-atụgharị ihe ndị a nʼuche, ọkụ ahụ nọ na-ere;
mgbe ahụ ekwuru m okwu sị:
“O Onyenwe anyị, gosi m ọgwụgwụ nke ndụ m
na ọnụọgụgụ ụbọchị m niile;
mee ka m mara na ndụ m na-agafe ngwangwa.
I meela ka ụbọchị m niile bụrụ naanị ihe dị nta;
ogologo afọ m niile adịghị ka ihe ọbụla nʼihu gị.
Ndụ onye ọbụla bụ naanị otu nkuume
ọbụladị ndị dịka ha guzosirike. Sela
“Nʼezie onye ọbụla na-ejegharị dịka onyinyo
nʼefu ka ha na-ekwogharị nʼotu ebe na nke ọzọ, na-akpakọba akụ,
na-amaghị onye ọ ga-abụ nke ya nʼikpeazụ.
“Ma ugbu a, Onyenwe m, gịnị ka m na-ele anya ya?
Olileanya m dị nʼime gị.
Zọpụta m site na mmehie m niile;
ekwela ka m bụrụ ihe ọchị nye ndị nzuzu.
Agbachiri m nkịtị, ajụrụ m ikwu okwu,
nʼihi na ọ bụ gị mere ihe a.
Kwụsị iti m ihe;
ihe otiti nke aka gị ezuola m ahụ.
Ị na-abara ndị mmadụ mba ma na-ata ha ahụhụ nʼihi mmehie ha;
ị na-eripịa akụnụba ha dịka nla,
mmadụ ọbụla bụ naanị otu nkuume. Sela
“O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m,
gekwaa ntị nʼakwa m maka enyemaka;
emechila ntị gị nye ibe akwa m.
Nʼihi ana m ebinyere gị dịka onye ọbịa,
dịka onye ije, dịka nna nna m ha mere.
Lepụ anya na-ebe m nọ, ka m nwee ike kporie ndụ ọzọ,
tupu m hapụ ebe a laa, a gaghị ahụkwa m ọzọ.”
Source notes (1)
- Footnote Job 2:10; Abụ 34:13; Jem 3:5-12
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.