Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 38

Abụ Ọma Devid. Arịrịọ.

Arịrịọ nʼoge nsogbu

Biko, Onyenwe anyị, abarala m mba nʼiwe,

maọbụ taa m ahụhụ mgbe iwe gị dị ọkụ.

Nʼihi na àkụ gị niile amapuola m ahụ,

aka gị adakwasịkwala m, dịka ọ bụ ọkpọ.

Nʼihi oke iwe gị, ọ dịghị izuoke dị nʼime anụ ahụ;

enweghịkwa m udo nʼime ọkpụkpụ m niile nʼihi mmehie m.

Mmetụta ikpe ọmụma m na-adakwasị m

dịka ibu arọ nke dị arọ karịa m.

Ọnya m na-ere ure na-asọ oyi

nʼihi mmehie enweghị uche m.

Abụ m onye a nyidara ma kwatukwaa nʼala

ogologo ụbọchị niile, ana m agagharị nʼiru ụjụ.

Azụ na-egbu m mgbu nke ukwuu

ahụ adịghịkwa m.

Ume ọbụla adịghịkwa nʼime. Adị m ka onye e gwepịara egwepịa.

Ana m asụ ude nʼihi oke ihe mgbu nke obi.

O Onyenwe m, ị maara agụụ niile nke na-agụ obi m;

ịsụ ude m ezokwaghị ezo nʼebe ị nọ.

Obi na-alọ m mmiri, ike na-agwụkwa m,

ìhè esitekwala nʼanya m pụọ.

Ndị m hụrụ nʼanya na ndị enyi m na-asọ m oyi nʼihi ọnya m,

ndị agbataobi m na-anọ m ebe dị anya.

Ndị na-achọ igbu m na-esiri m ọnya,

ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ na-ekwu maka ihe dakwasịrị m;

ogologo ụbọchị niile ha na-agba izuzu aghụghọ.

Adị m ka onye ntị chiri, onye na-apụghị ịnụ ihe ọbụla,

dịka onye ogbu, onye na-apụghị imeghe ọnụ ya.

Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe,

onye ọnụ ya apụghị ịsa okwu.

O Onyenwe anyị, ana m eche gị;

o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza.

Nʼihi na asịrị m, “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m;

maọbụ bulie onwe ha elu nʼebe m nọ mgbe ụkwụ m na-agbuchapụ.”

Nʼihi na lee, ana m achọ ịda ada.

Anọkwa m nʼọnọdụ oke mgbu.

Ana m ekwupụta mmehie m;

mmehie m na-ewute m.

Ndị iro m, ndị na-eme ihe ike dị ọtụtụ,

ndị na-akpọ m asị, na-enweghị ihe m mere, bara ụba.

Ndị na-eji ihe ọjọọ akwụghachi m ezi ihe,

na-ebo ebubo megide m

nʼagbanyeghị na m na-achọ ime naanị ezi ihe.

O Onyenwe anyị, ahapụkwala m;

O Chineke m, anọkwala m ebe dị anya.

Bịa ọsịịsọ inyere m aka

Onyenwe m na Onye nzọpụta m.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.