Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 32
Abụ Ọma Devid. Abụ Maskil.
Nkwupụta na mgbaghara mmehie
Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ,
onye a gbaghaara ajọ omume ya niile,
onye e kpuchikwaara mmehie ya niile.
Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ,
onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya,
onye ahụ nke aghụghọ ọbụla na-adịghịkwa nʼime mmụọ ya.
Mgbe m gbachiri nkịtị,
ọkpụkpụ m rere ure
site nʼịsụ ude m ogologo ụbọchị niile.
Ehihie niile na abalị niile,
ị tara m ahụhụ,
ume dị m nʼobi gwụchara,
dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị.1 Sela
Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị,
kwụsịkwa izo ha ezo.
Agwara m onwe m okwu sị,
“Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị.”
Ị gbaghakwaara m
ikpe ọmụma nke mmehie m niile. Sela
Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere
mgbe e nwere ike ịchọta gị;
nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa,
ọ gaghị erute ha.
Gị onwe gị bụụrụ m ebe nzuzo;
Ị ga-echebekwa m ka nsogbu ọbụla hapụ irute m nso.
Ọ bụkwa abụ nzọpụta ka i ji gbaa m gburugburu. Sela
Aga m eme ka ị nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso;
Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị.
Adịkwala ka ịnyịnya maọbụ ịnyịnya ibu
nke na-enweghị akọnuche,
nke a na-aghaghị iji mkpụmkpụ igwe na eriri kechie ọnụ ya, ijide ya,
ma emeghị otu a, ọ gaghị abịakwute gị.
Ọtụtụ ihe mgbu na-abịakwasị ndị na-eme ihe ọjọọ,
ma ịhụnanya Onyenwe anyị nke na-enweghị ọgwụgwụ,
na-agba onye ahụ tụkwasịrị ya obi gburugburu.
Ṅụrianụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nweekwanụ obi ụtọ, unu ndị ezi omume;
bụọ abụ, unu ndị obi ha ziri ezi.
Source notes (1)
- Footnote Mgbe anwụ na-amịkọrọ mmiri dị nʼala
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.