Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 33

Ịdị mma na ịdị ukwuu Onyenwe anyị

Tienụ mkpu ọṅụ nye Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume;

nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ndị obi ha ziri ezi too ya.

Werenụ ụbọ akwara too Onyenwe anyị;

werenụ une nke nwere akwara iri kpọọrọ ya egwu.

Bụkuonụ ya abụ ọhụrụ;

were ǹka kpọọ ụbọ akwara ma tiekwa mkpu ọṅụ.

Nʼihi na okwu Onyenwe anyị niile ziri ezi bụrụkwa eziokwu;

o kwesiri ntụkwasị obi nʼọrụ ya niile.

Onyenwe anyị na-ahụ ezi omume na ikpe ziri ezi nʼanya;

ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya ya nke na-enweghị ọgwụgwụ.

Ọ bụ site nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị ka e ji kee eluigwe niile,

jirikwa nkuume nke ọnụ ya mee anwụ, na ọnwa na kpakpando niile.

Ọ bụ ya kekwara osimiri niile chịkọta ha nʼotu ebe,

kpaa oke ebe ha ga-anọ dịka ụlọakụ dị ukwuu.

Ka ụwa niile tụọ Onyenwe anyị egwu;

ka mmadụ niile bi nʼụwa sọpụrụ ya.

Nʼihi na o kwuru okwu, okwu ahụ mezukwara;

o nyere iwu, iwu ahụ guzokwara chịm.

Onyenwe anyị na-emebi atụmatụ mba niile;

ọ na-emebi ebumnobi ụmụ mmadụ.

Atụmatụ Onyenwe anyị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,

ebumnobi ya ruo ọgbọ niile.

Mba a gọziri agọzi ka mba ahụ bụ, bụ ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha;

bụ ndị ọ họpụtara ka ha bụrụ ihe nketa ya.

Onyenwe anyị si nʼeluigwe na-ele ndị mmadụ bi nʼụwa anya.

Ọ na-ahụzu ụmụ mmadụ niile anya.

O sitere nʼebe obibi ya na-ele

onye ọbụla bi nʼelu ụwa anya.

Ebe ọ bụ ya kpụrụ obi mmadụ niile nʼotu na otu;

ọ na-ahụzu, na-amazukwa ihe niile ha na-eme.

Ọnụọgụgụ ndị agha eze apụghị ịzọpụta ya;

o nweghị onye agha ọbụla na-azọpụta onwe ya, site nʼịdị ukwuu nke ike ya.

Ịnyịnya agha ezukwaghị iwetara ndị na-agba ha mmeri nʼagha.

Ọ bụ ezie na ịnyịnya dị ike, ma ha apụghị ịzọpụta ndị nwe ha.

Ma Onyenwe anyị ji anya ya na-eche ndị niile na-atụ ya egwu nche,

ya bụ ndị niile na-atụkwasị obi ha nʼịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ.

Ọ ga-anapụta ha site nʼaka ọnwụ.

Ọ ga-echebekwa ha ọ bụladị nʼoge ụnwụ.

Anyị ji olileanya eche Onyenwe anyị;

ọ bụ ya bụ inyeaka anyị na ọta anyị.

Obi anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime ya;

nʼihi na anyị tụkwasịrị aha nsọ ya obi.

O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị na-adịgidere anyị,

dịka olileanya anyị dị na gị.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.