Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 31

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.

Oge m dị gị nʼaka

Onyenwe anyị, nʼime gị, ka m gbabara izere ndụ;

ekwela ka ihere1 mee m;

site nʼezi omume gị gbapụta m.

Tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m,

bịa ngwangwa gbapụta m;

ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba,

ebe mgbaba e wusiri ike maka nzọpụta m.

Ebe ị bụ oke nkume m na ebe mgbaba m e wusiri ike,

nʼihi aha gị, duo m ma na-edukwa m.

Napụta m site nʼọnya nke e zobere nʼihi m,

nʼihi na ọ bụ naanị gị bụ ebe mgbaba m siri ike.

Nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m;

gbapụta m, o Onyenwe anyị, Chineke, onye eziokwu.

Akpọrọ m ha asị bụ ndị niile na-efe chi mba ọzọ ndị na-abaghị uru;

ana m atụkwasị Onyenwe anyị obi m.

Aga m enwe obi ụtọ ma ṅụrịkwaa ọṅụ nʼime ịhụnanya gị,

nʼihi na ị hụrụ nsogbu m

marakwa ihe mgbu nke mmụọ m.

I wereghị m nyefee nʼaka ndị iro m,

kama i nyela m ohere ijegharị ebe ọbụla m chọrọ.

O Onyenwe anyị, meere m amara nʼọnọdụ ihe mgbu m.

Anya m abụọ na-acha uhie uhie nʼihi ịkwa akwa;

ike adịghịkwa m.

Iru ụjụ eriela m ahụ;

ịkwa akwa m ewepụla ihe nʼafọ m;

ihe mgbu m mere ka ike gwụsịa m

ruo na ume adịghịkwa nʼọkpụkpụ m.

Nʼihi ndị iro m niile;

ndị agbataobi m na-elelị m anya.

Ndị enyi m na-atụ ụjọ ịbịakwute m,

ndị hụrụ m nʼokporoụzọ na-esite ụzọ ọzọ gafee.

Aghọọla m onye e chefuru echefu, dị ka a ga-asị na m nwụrụ anwụ.

A pụrụ iji ite kụwara akwụwa tụnyere m.

Anụla m nkwulu ha megide m;

oke egwu dị nʼakụkụ niile;

ha na-agba izu megide m,

na-agba izu nzuzo iji napụ m ndụ m.

Ma ana m atụkwasị gị obi Onyenwe anyị.

Ekwuola m ya sị, “Naanị gị bụ Chineke m.”

Oge m niile dị gị nʼaka.

Napụta m nʼaka ndị iro m

na nʼaka ndị ahụ na-adịghị ezu ike ịchụ m ọsọ.

Mee ka amara gị mụkwasị ohu gị dịka anyanwụ;

zọpụta m nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ.

O Onyenwe anyị, ekwela ka ihere mee m,

nʼihi na akpọkuola m gị;

kama mee ka ihere mee ndị na-eme ihe ọjọọ,

ka ha tọgbọrọ nʼala mmụọ debe ọnụ ha duu.

Ka ọnụ ahụ ha ji ekwu okwu ụgha mechie kpamkpam;

nʼihi na ọ bụ site na mpako na nlelị

ka ha ji na-ekwu okwu megide ndị ezi omume.

Lee ka ịdị mma gị si baa ụba,

nke i na-edebere ndị niile na-atụ egwu gị,

nke ị na-enye ndị na-agbaba nʼime gị,

nʼihu ọha mmadụ.

I na-ezobe ha nʼebe nzuzo gị

pụọ nʼizu nzuzo nke ụmụ mmadụ;

ị na-echebe ha nʼime ebe obibi gị;

ka ha pụọ nʼebubo nke ire dị iche iche.

Otuto dịrị Onyenwe anyị

nʼihi na o gosila m ịhụnanya ya dị ukwuu

mgbe m nọ nʼobodo ndị iro gbara gburugburu.

Akụjara m, kwuo okwu nʼụjọ sị,

“Ewezugala m site nʼihu ya!”

Ma ị nụrụ arịrịọ m maka ebere

mgbe m kpọkuru gị ka i nyere m aka.

Hụnụ Onyenwe anyị nʼanya, unu ndị ya niile kwesiri ntụkwasị obi,

nʼihi na Onyenwe anyị na-anapụta ndị niile kwesiri ntụkwasị obi nye ya,

ma ọ na-akwụghachi ndị mpako oke zuru ezu.

Ya mere, dịrịnụ ike, ka obi siekwa unu ike,

unu niile ndị olileanya ha dị nʼime Onyenwe anyị.

Source notes (1)
  1. Footnote Ihere Maọbụ, ihe na-eweta ọnụma ma ọ bụkwanụ, ọnọdụ ịkwa emo

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.