Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 3
Abụ Ọma Devid. Nke o dere mgbe o si nʼihu Absalọm gbapụ ọsọ ndụ.
Ekpere maka enyemaka
O Onyenwe anyị, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m.
Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị,
“Chineke agaghị azọpụta ya.” Sela1
Ma gị, Onyenwe anyị bụ ọta na-ekpuchi m;
I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ.
Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa,
ọ nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. Sela
Edinara m ala, hie ụra,
ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na Onyenwe anyị na-eche m nche.
A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu,
agaghị m atụ egwu ọbụla.
Bilie Onyenwe anyị!
Zọpụta m Chineke m!
Tie ndị iro m niile aka nʼagba;2
tipụkwa ndị ajọ omume eze nʼọnụ.
Nʼihi na nzọpụta na-esite nʼebe Onyenwe anyị nọ na-abịa.
Ka ngọzị gị dịịrị ndị gị niile. Sela
Source notes (2)
- Footnote Okwu Hibru nʼusoro abụ nke a na-amaghị ihe ọ pụtara, ụfọdụ na-eche na ọ bụ okwu ntụziaka nye ndị ọbụ abụ banyere ihe ha ga-eme
- Footnote Job 16:10
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.