Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 2
Onye Chineke tere mmanụ
Gịnị mere mba niile ji agba izu nzuzo?1
Gịnị mere ndị mmadụ ji na-apịa ọpịpịa nke na-abaghị uru?
Ndị eze nke ụwa na-eguzokwa onwe ha,
ndị na-achị achị na-agbakọtakwa
imegide Onyenwe anyị na imegide Onye ya e tere mmanụ.
Ha na-asị, “Ka anyị tijie mkpọrọ igwe niile ha kere anyị
ma tufukwaa ha, nwere onwe anyị.”
Onye na-anọdụ nʼeluigwe na-achị ọchị.
Onyenwe anyị na-akwa ha emo.
Mgbe ahụ, ọ na-eji iwe baara ha mba
mee ka ụjọ jupụta ha obi nʼihi oke iwe ya.
“Mụ onwe m eguzobela m eze m
na Zayọn, ugwu m dị nsọ.”
Aga m ekwusa iwu Onyenwe anyị:
Ọ sịrị m, “Ị bụ Ọkpara m;
taa abụrụla m nna gị.
Rịọọ m,
aga m enye gị mba niile nke ụwa
ka ha bụrụ ihe nketa gị.
Ị ga-eji mkpara igwe chịa ha,
tipịa ha dịka onye na-akpụ ite si etipịa ite ndị ọ kpụrụ na-adịghị mma.”
Nʼihi nke a, unu ndị eze, bụrụnụ ndị nwere uche;
ka nke a bụrụkwa ihe ịdọ aka na ntị nye ndị na-achị achị nʼụwa.
Jirinụ ịtụ egwu fee Onyenwe anyị ofufe;
jirikwanụ ịma jijiji ṅụrịa ọṅụ nʼihu ya.
Sutukwanụ Ọkpara ahụ ọnụ ka iwe ghara iwe ya,
ka unu ghara ị bụ ndị a lara nʼiyi nʼụzọ unu.
Nʼihi na iwe ya pụrụ ịmalite nʼotu ntabi anya.
Ndị niile na-eme ya ebe mgbaba ha bụ ndị a gọziri agọzi.
Source notes (1)
- Footnote Ya bụ, ịgbakọta nʼihi izu ọjọọ
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.