Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 4

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nke a na-eji ụbọ akwara akpọ.

Ntụgharị uche nke abalị

Zaa m mgbe m na-akpọku gị

Chineke m, gị onye ezi omume;

Napụta m site nʼihe mgbu m,

meere m ebere, nụrụkwa ekpere m.

Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga-atụgharịa ebube m, mee ka ọ bụrụ ihe ihere?

Ruo ole mgbe ka unu ga-ahụ ihe efu nʼanya na-achọ chi ndị ahụ na-abụghị chi nʼezie?1 Sela

Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị ahọpụtala ndị ezi omume nye onwe ya;

ọ ga-egekwa ntị nʼolu m mgbe ọbụla m kpọkuru ya.

Maanụ jijiji, unu emehiekwala;

mgbe unu nọ nʼelu ihe ndina unu;

nọọnụ jụụ na-enyocha obi unu. Sela

Tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi unu,

chụkwaranụ ya aja ezi omume.

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ, “Onye pụrụ imere anyị ihe ọma?”

Ma Onyenwe anyị, biko mee ka ìhè nke ihu gị mụkwasị anyị.

Were ọṅụ mejupụta obi m

karịa mgbe mkpụrụ ubi, ya na mmanya ọhụrụ ha bara ụba nke ukwuu.

Aga m edina ala ma rahụ ụra nʼudo,

nʼihi na ọ bụ naanị gị Onyenwe anyị,

na-eme ka m nọrọ na-enweghị ihe egwu ọbụla.

Source notes (1)
  1. Footnote Nke unu maara na ha bụ okwu ụgha

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.