Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 19

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid.

Akaọrụ Chineke na iwu ya

Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke;

mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya.

Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu,

ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma.

Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu,

ma a na-anụ ụda ha.

Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo,

okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ.

Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ.

Ọ dị ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ mgbe o si nʼụlọ ndina ya na-apụta,

dịka ọgba ọsọ nke ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịgba ọsọ ịsọ mpi.

Ọ na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe,

bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ.

Ọ dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya.

Iwu Onyenwe anyị zuruoke;

ọ na-eweghachi mkpụrụobi.

Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi;

ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe.

Iwu Onyenwe anyị ziri ezi,

ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ.

Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke,

ọ na-enye anya ìhè.

Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha,

ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi;

ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike,

ha niile bụkwa ihe ziri ezi.

Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo,

karịa ọlaedo a nụchara anụcha;

ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ,

karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ.

Ọ bụ site na ha ka a na-adọ ohu gị aka na ntị;

ụgwọ ọrụ dị ukwuu dị nʼidebe ha.

Onye pụrụ ịghọta amaghị ama ya niile?

Gbaghara m ihe niile zoro ezo nke adịghị ike m.

Chebe m, ka m ghara ilezi anya mehie megide gị.

Ekwela ka ha na-achị achị na ndụ m.

Mgbe ahụ ka m ga-abụ onye zuruoke,

onye nwere onwe ya site nʼebe ihe ọjọọ niile nke mmehie dị.

Kwere Onyenwe anyị, Onye mgbapụta m, na Oke nkume nchebe m,

ka okwu ọnụ m niile, na echiche obi m niile,

bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, na nke ị na-anabata.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.