Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ
Abụ Ọma 20
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid.
Ekpere maka enyemaka
Ka Onyenwe anyị zaa gị nʼụbọchị nsogbu gị;
ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị.
Ya sitekwa nʼebe nsọ ya zitere gị inyeaka,
ma site na Zayọn kwagide gị.
Ya chetakwa aja niile ị chụrụ,
ma nabata aja nsure ọkụ niile ị chụrụ nye ya. Sela
Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ,
mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma.
Anyị ga-eti mkpu ọṅụ maka mmeri i meriri,
buliekwa ọkọlọtọ anyị elu nʼaha Chineke anyị.
Ka Onyenwe anyị mezuo arịrịọ gị niile.
Ugbu a, amaara m
na Onyenwe anyị na-azọpụta onye ya o tere mmanụ;
ọ na-esite nʼebe nsọ ya nʼeluigwe jiri aka nri ya,
zọpụta ma zakwaa ya.
Ụfọdụ na-atụkwasị obi ha na ịnyịnya, ndị ọzọ nʼụgbọ agha;
ma anyị na-atụkwasị aha Onyenwe anyị, Chineke anyị, obi.
Ha na-egbu ikpere nʼala ma daa,
ma anyị ga-ebili, kwụrụ chịm.
O Onyenwe anyị, zọpụta eze!
Zakwaa anyị mgbe anyị kpọkuru gị!
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0. Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.
Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.