Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 18

Abụ ọma Devid. Abụ Devid ohu Onyenwe anyị. Ọ bụụrụ Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl. Ọ sịrị:

Abụ mmeri

O Onyenwe anyị, ahụrụ m gị nʼanya, gị bụ ike m.

Onyenwe anyị bụ oke nkume m, na ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m.

Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya.

Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m, na oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya.

Akpọkuru m Onyenwe anyị, onye e kwesiri inye otuto,

ọ zọpụtara m site nʼaka ndị iro m.

Ụdọ niile nke ọnwụ kere m agbụ;

ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.

Ụdọ nke ili kere m gburugburu,

ọnya nke ọnwụ guzogidere m.

Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị;

etiri m mkpu akwa, kpọkuo Chineke m ka o nyere m aka;

akwa m rutekwara ya ntị,

o sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m.

Ụwa mere mkpọtụ, maa jijiji,

ntọala niile nke ugwu niile makwara jijiji,

ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya.

Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta,

ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta;

icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta.

O kewara mbara eluigwe, rịdata;

oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya.

Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim1 felie elu,

o feliri elu nʼelu nku nke ifufe.

O mere ọchịchịrị ebe nzuzo ya, ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu,

bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe.

Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, igwe ojii

ji mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe gabiga.

Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ;

olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda.

Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa,

o jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha.

E kpughere ala ala nke oke osimiri,

gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ,

site nʼịba mba gị, O Onyenwe anyị,

na nkuume si gị nʼimi pụta.

O sitere nʼelu setịpụ aka ya,

jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile.

Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike,

bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m.

Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m,

ma Onyenwe anyị bụrụ m ihe ndabere.

Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara,

ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ.

Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị;

ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị.

Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị,

ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ.

Iwu ya niile dị nʼihu m,

esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m.

Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya,

edebekwara m onwe m pụọ na mmehie.

Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị,

dịka ịdị ọcha nke aka m abụọ si dị nʼanya ya.

Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi,

nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke.

Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha,

ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ.

Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi,

ma ị na-eme ka ndị nwere anya mpako dị ala.

Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, na-eme ka oriọna m na-enwu,

Chineke m na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè.

Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ,

sitekwa na Chineke m, apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla.

Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke,

okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha;

ọ bụ ọta2 nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya.

Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị?

Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị?

Ọ bụ Chineke na-enye m ike,

na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.

Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele;

Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu.

Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha,

ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz.

Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m,

aka nri gị na-akwagidekwa m,

inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.

Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ,

ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ.

Achụrụ m ndị iro m ọsọ, jidekwa ha;

alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi.

Etidara m ha nʼala ebe ha enwekwaghị ike ibilite.

Ha dara nʼokpuru ụkwụ m.

Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha,

i wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m.

I mere ka ndị iro m tụgharịa gbapụ ọsọ.

Ebibikwara m ndị kpọrọ m asị.

Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha.

Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha.

Egwepịara m ha nke ọma dịka ntụ nke ikuku na-ebufu;

a zọtọrọ m ha dịka apịtị nke okporoụzọ.

Ị napụtala m site nʼaka ndị na-alụso m ọgụ

ị meela m onyeisi nke ọtụtụ mba;

ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi.

Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu,

ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m.

Obi na-ada ha mba;

ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta.

Onyenwe anyị na-adị ndụ! Otuto dịrị oke nkume m!

Mbuli elu dịrị Chineke, Onye nzọpụta m.

Ọ bụ Chineke ahụ onye na-abọrọ m ọbọ,

onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m,

onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m.

I mere ka m dị elu karịa ndị iro,

napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike.

Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche,

aga m abụku aha gị abụ otuto.

Ọ na-enye eze ya mmeri dị ukwuu;

Ọ na-egosikwa onye ya onye e tere mmanụ ịhụnanya na-adịghị ada ada,

nye Devid na ndị agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi.

Source notes (2)
  1. Footnote Cherubim bụ mmụọ ndị ahụ dị ike na ndị jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ. Ọrụ ha bụ ibu ocheeze Ebube ahụ. Izk 1:26
  2. Footnote Ya bụ, ebe nchebe

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.