Skip to content
BibleKenya

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ

Abụ Ọma 17

Ekpere Devid.

Ekpere maka nnapụta

O Onyenwe anyị, nụrụ arịrịọ m ziri ezi,

nụrụkwa mkpu akwa m.

Gee ntị nʼekpere m

nʼihi na o siteghị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu okwu aghụghọ.

Ka mkpepụta m si nʼaka gị bịa;

ka anya gị hụ ihe ziri ezi.

Ọ bụ ezie na ị nyochaala obi m,

i letala m nʼabalị, nwalekwaa m,

ị ga-achọpụta na o nweghị ihe ọ ọjọọ bụla m zubere,

na ọnụ m ekwuhiebeghị.

Ndị mmadụ agbalịala inye m ngarị

ma anaghị m ekwe ka mụ na ndị na-eme ihe ike nwee mmekọrịta

nʼihi iwu sitere nʼegbugbere ọnụ gị.

Nzọ ụkwụ m akpafubeghị site nʼụzọ gị,

ụkwụ m agbụchapụghịkwa site nʼọnọdụ ya.

Ana m akpọku gị, O Chineke, nʼihi na amaara m na ị ga-aza m;

gee m ntị ma nụrụ ekpere m.

Zipụta ịhụnanya gị dị oke ebube;

gị onye na-eji aka nri gị dị ike azọpụta

ndị niile gbabara na gị site nʼaka ndị iro ha.

Chebe m dịka mkpụrụ anya gị;

zoo m na ndo nke nku gị,

site nʼaka ndị ajọ omume gbara m gburugburu,

ọ bụladị ndị iro m, ndị chọrọ igbu m.

Ha anaghị eme ebere, ha bụ ndị afọ tara mmiri,

okwu ịnya isi juru ha ọnụ.

Ha achọpụtala ebe m nọ, ugbu a, ha gbara m gburugburu,

ha ji anya nkọ, jikerekwa ịtụ m nʼala.

Ha ka ọdụm agụụ na-agụ nke zoro onwe ya nʼọhịa,

dịka ọdụm dị ike na-eche ihe ọ ga-adọgbu.

Onyenwe anyị, bilie guzogide ha, tigbuo ha.

Jiri mma agha gị zọpụta m site nʼaka ndị ajọ omume.

O Onyenwe anyị, zọpụta m site nʼaka ndị dị otu a,

site nʼaka ndị ụgwọ ọrụ ha bụ nʼụwa a.

Ka ihe ịkpakọbara debere ndị ajọ omume jupụta afọ ha,

ka afọ jukwa ụmụ site nʼihe ndị a,

ka ha hapụrụ ihe fọdụrụ nye ụmụntakịrị ha.

Ma mụ onwe m ga-ahụ ihu gị site nʼezi omume;

mgbe m ga-ebili, afọ ga-eju m nke ọma, nʼihi na aga m ahụ gị ihu na ihu.

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ. Copyright © 2020 Biblica, Inc. Licensed under CC BY-SA 4.0.  Biblica® is a trademark registered by Biblica, Inc. Source: eBible.org. Typeset from the source files; no intended changes to scripture wording. BibleKenya is not endorsed by the rights holder.

Full source notice & licence · CC BY-SA 4.0 · SourceEdition imported 2026-10-25.

BibleKenya

Reader settings

Theme
Font
Alignment
Reading width

Saved in this browser and used offline too. Press ? for keyboard shortcuts.